You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ a: George Weah emeela ihe o jiri bụrụ dike
Akụkọ ndị dị mkpa:
N'egwuregwu,
Onyeisiala mba Liberia George Weah gbara ala ya bọọlụ ụnyaahụ mgbe ha na Naịjirịa sọkọtara mpi enyi na enyi na Monrovia.
Nke a mere iji kwanyere uwe nke akara ya bụ iri na anọ ugwu ikpeazu dịka ya bụ uwe ga-ala ezumike nka na Liberia.
Ọzọ,
Aka na-achị Enugu steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi amanyela kọmitii ga-ahụ maka nwulite ọdọ ụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugwu.
O kwuru na ọ dị mkpa ka ọdịda anyawu nwee ọdọụgbọelụ nke mba ofesi nakwa na ọ ga-ahụ na e mezuru ya.
Gọọmentị etiti enyela steeti dị icheiche iwu ha ga-emezu maọbụrụ na ha chọrọ iketa oke n'ime ego akpọrọ Paris Club refund.
Ihe ndị a gụnyere ịkwụ ndịọrụ ụgwọ ọnwa nakwa ị kwụghachị ego niile ha bitere n'aka gọọmentị etiti
Na mba ofesi,
Naanị otu ọdọ ụgboelu na-arụ ọrụ na mba Tripoli agbachiela n'abali Tuusde mgbe a tụrụ ya ogbunigwe.
Rue ugbua amabeghị ma o nwere onye nwụrụ maọbụ ihe mere mmebi na ya bụ ọdọ ụgbọelu.
Gee nkeji nke ụtụtụ a:
Ihe onyonyo nke taa: