You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
MTN: Gịnị jikọrọ ha na ndị gọọmentị etiti?
Gọọmentị Naịjirịa adaala MTN nha ụtụisi ruru ijeri dọla abụọ nke kwaturu oke ha n'ahịa oke ụbọchị tusde.
O tebeghi aka ụlọakụ ukwu nke Naijirịa nyere iwu ka ụlọọrụ MTN dị na Legọs weghachite ego ruru ijeri dọla asatọ ha bupuru n'ụzọ daara iwu.
N'akwụkwọ ozi e depụtara iji kọwaa ihe gbasara ya bụ ego ụlọakụ ukwu kwuru na MTN ji asambodo na-akwụghị ọtọ wee zịga ego mba ofesi, MTN kwuru na ha na ndị ọkaiwu kachasị na Naijirịa na-eme nyocha ihe gbasara ịkwụ ụtụisi ụlọọrụ ha.
MTN kwuru na ha akwụọla ihe ruru dọla nari asaa nke kpuchitere ụtụisi a na-ekwu maka ya.
Akụkọ kwuru na kemgbe a machara MTN nha, oke wụturu ọfụma n'ahịa oke kemgbe ụtụtụ Tuusde.