You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ kachasị mkpa taa: CAF amapụla ndị ọgba bọọlụ abụọ
N'egwuregwu,
Ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bọolụ na Africa amapụla ndị ọgbabọọlụ Naịjirịa abụọ n'isonye n'asọmpị nke U-17 a ga agba na Niamey maka afọ ha dị karịrị iri na asaa.
Naijiria na BurkinaFaso ga-asọmpị echi n'elekere anọ iji mata onye ga-etozu ị ga asọmpị AFCON.
Na Delta steeti taa,
Otu mmadụ anwụọla mmadụ anọ meruru ahụ ebe ụfọdụ ka tọrọ n'okpuru ụlọụka dasara ndị mmadụ ebe ha na-aka ụka ụtụtụ na Deta steeti.
Onyeisi ụlọomeiwu ukwu Bukola Sararki ekwuola na ya ga-enyeaka chọpụta ma gwọọ ndị pụtara n'ihe a.
Ọzọ,
Onyeisiala Muhammadu Buhari na ndị Naịjirịa na mba China enweela nzụkọ na mkparịta ụka ụnya ahụ dịka ọ gara mba ahụ.
Na nzụkọ ahụ o kwuru na ụjọ anaghị atụ ya gbasara ntuliaka kwụọtọ na 2019 maka na ọ bụ ihe oji banye ọchịchị .
Na mba ofesi,
Ihe karịrị mmadụ puku iri emela ngagharị iwe n'ihi oge ezumike nka na mba Rọshịa.
Gọọmentị mba ahụ na-akwado ịme oge ezumike nka afọ iri isii n'atọ maka ụmụnwaanyị na afọ iri iss n'ise maka ụmụnwoke.
N'ụtụtụ
AMVCA kpọpụtara ndị ụlọ fiim ụnyaahụ
Ndị ihe nkiri si Naijirịa na mba ndị ọzọ n'Afrịka gbakọrọ na Legọs unyaahụ maka emume akpọrọ Africa Magic Viewers Choice Awards.
Emume nke afọ a bụ nke isii kemgbe ebidoro ịtụ ndị ihe nkiri ugo site na atụmatụ a.
Ndi ihe nkiri zuru ka emee na ya bụ emume ebe ndị tụrụ ugo dika Adekola Odunlade, Omotola Jolade, Nyce Wanueri na ndị ọzọ.
Aka m adịghị ya! - Rotimi Amaechi
Rotimi Amaechi bụ onye chiburu Rivers steet kwuru na ọbụghị eziokwu na ọ họpụtara onye ga-azọ ọkwa gọvanọ n'APC n'ime Rivers Steeti.
Akụkọ na-ekwu na ọ họpụtara Tonye Cole bụ onye ojiegoachọego ama ama, mana Amaechi kwuru na ọ bụ ndị iro na-ekesa akụkọ a.
Nd agha Naịjirịa agọọla ebubo
Ndịagha Naịjirịa na-ekwu na akụkọ ndị ntaakụkọ AFP dere na ndị Boko Haram gbagburu ndị agha Naịjirịa n'ụbọchị ole ole gara aga abụghị eziokwu.
Ndị agha kwuru na ọ bụ ndị otu ha gbagburu ọtụtụ n'ime ndị agha Boko Haram.
AFP dere na ndị Boko wakporo ndịagha Naịjirịa n'obodo Zari n'ime Borno steeti, nakwa gbuo ndị agha ruru iri atọ.
US esepụọla aka enyemaka na Palistine
Na mba ofesi, goomentị Amerika ekwuola na ha ga-akwụsị ịnye ego enyemaka ha na-enye ndị Palistine.
Amerika kwuru na ha ga-akwụsị ịkwụ ego a ruru nde dọla narị atọ makana Palistine ka na-anabata ọtụtụ ndị agha iyi egwu n'ala ha.
Gee akụkọ anyị n'ụtụtụ a
Lee ihe nkiri anyị