You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Kolo ego: Ọ bụ ndị mmụọ ka ọ bụ oke yi akwa na-ezu ego ndị mmadụ?
Ụfọdụ ndị ekwenyela na ọ bụghị 'juju' na-akpị ego ndị mmadụ na-atụkọta na 'kolo' ha, na ọ bụ ha na-ezu ụmụnne ha ohi.
N'ime mkpụrụ ụbọchị ole na ole gara aga, ọtụtụ ndị mmadụ ọkachasị ụmụnwaanyị bidoro ikwu n'elu soshal midia etu ego ha na-atụkọ n'ime kom kom a na-akpọ 'kolo' si na-efu na-emetụghị ya aka.
Ụfọdụ ndị sị na ọ bụ ndị kapịnta rụrụ ya bụ kolo na-eji ọgwụ ewere ego ọbụla na-abanye n'ime ya.
Ụfọdụ kwuru na ha atụkọọla ego ahụ ebe ọ ga-amụtara ha ọkpụrụkpụ ego, mana ihe anya ha hụrụ ka ha meghere ebe ego ahụ dị gbara ha anyammiri.
Otu nwaanyị aha ya bụ Laila Ijeoma jụrụ na Twitter sị na ọ bụ 'ọgwụ ka ọ bụ nsị'?
Nke a malitere okwu ebe ụfọdụ kwenyere na ha na-ezu ego ndị na-atụkọ ego na kolo ha, ebe ndị ọzọ kwuru na ọ bụ 'ọgwụ' n'ezie, maka na ha agaghị akọnwanwu etu ego ahụ si efu.
'Ọ bụ 'ọgwụ'
@nkechiaj kwuru na o mere nne ya (ebe o tụkọchara ego o fuo).
@Ekiyokeyerin kwuru na ọ bụ ọgwụ, makana o mere nwanne ya nwoke.
O kwukwara na ndị na-ere ya na-eji ọgwụ amịpụ ego n'ime ya.
'Ọ bụ ohi'
@iamfia_A_Chris kwuru na o zuru nne ya ohi were zụọ 'Ps2'.
@MileyBrian2 kwuru na oge nke ya mere, na ọ bụ ụmụ nwanne ya zuru ya ohi.
@Adegboy23826114 kwuru na nwanne ya nwoke nọ na-ezuru nke ya.
@nkechiaj kwuru sị na ọ ga-aga nwụchie kapịnta rụrụ nke ya ma ọ bụrụ na ọ hụghị ego nke ya ma o meghee ya, makana ọ bụ naanị ya bi n'ụlọ.