A tụọla ndị Naịjiria abụọ nga mkpụrụ ọka maka ịgba mgbere mmadụ

Ụlọikpe dị na Saụt Afrịka atụọla ndị Naịjrịa abụọ nga mkpụrụ ọka maka ịgba mgbere mmadụ

ụlọrụakụkọ Saụt Afrịca, www.dfa.co.za kwuru na a nwụchiri Frank Amaku na Ilo Promise Somadina n'ọnwa Eprelụ afọ 2016 n'ụlọ ọrịrị na ọṅụnụ dị na Fourway, ebe ha jichiri ndị ha ji n'ọrụ.

A mara mmadụ abụọ ahụ ikpe maka ebubo ịtọrọ ụmụnwaanyị, were ha na-akpara ego nakwa idebe ha n'ọnọdụ ahụhụ dị icheiche.

A zọpụtakwara mmadụ ise ha kpachiri kpọgaha ebe nchekwa.

Otu onye n'ime ụmụnwaanyị ndị a boro ebubo na ha kwewwere ya nkwa ọrụ, were si na obodo ya bụ Upington kpọga ya ebe ọzọ, ebe ha manyere ya ịṅụ ọgwụ ike, see ya foto ebe ọ gba ọtọ nke ha tinyere na websait.

Ọ kwukwara na ha na-ebu ya gaa be ụmụnwoke maka mmekọrịta maja ya na ha ga-egbu ya ma ọ bụrụ na ya kpọ ndị ikwu na ibe ya.

Ebe ndị amara ikpe gọrọ na ha emeghị ya, ma kwuo na ha ga-agbagharị akwụkwọ.

Ọnyeisi ngalaba na-ahụ maka inyocha mpụ na mba Saụt Afrịka bụ Godfrey Lebeya kwuru na mkpebi ahụ ga-abụ ịdọ aka na ntị nye ndị na-akpagbu ụmụnwaanyị.

Onye ọkaiwu ha rịọrọ ka e mere ha ebere n'ihi na ha ka dị obere mgbe ha mere mpụ ahụ n'afọ 2016.

Akụkọ ga-amasị gị: