You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Onye ntọ kwesiri ịnata ọgwụgwọ - Dibia bekee
Otu dibia bekee bụ Ebuka Akahara ekwuola na nwoke ahụ ejidere ebe ọ gara ị tọrọ mmadụ kwesiri ị gaa ụlọọgwụ nweta nyocha zuru oke.
Akahara kwuru na ọgwụ Tramadol na-eme ụfọdụ ihe n'ime ahụ mmadụ dịka ịtụ ụra, ịhọ agbọọ, ịta afọ mana ọ pụghị ime ka mmadụ rahụ ụra rue abali isii.
N'ọnụ ya "mmadụ ịṅụ oke Tramadol nwereike ị taa onye ahụ afọ mana ndị uweojii kwesiri ịburu nwoke ahụ gaa ụlọọgwụ"
Cheta na ndị uweojii nwụchiri otu nwoke gara ịtọ mmadụ ruru ebe ahụ rahụ ụra.
Akụkọ pụtara taa kwuru na rue ugbua ọ ka nọ na-ehi ụra kpatara na ndị mmadụ na-ekwu ka ebuga ya ụlọọgwụ mee ahụ ya nyocha.
Lee ihe ọ gwara BBC n'uju ebe a