You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ndụ Ekweremadu dị n'aka Ndume - Ndị ụlọomeiwu Igbo
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:
Akụkọ ndị dị mkpa n'abalị a:
Osote onyeisiala na-arụ ọrụ dịka onyeisiala ugbua bụ Yemi Osinbajo ejirila iwe chụtuo onyeisi ndị ọrụ nchekwa DSS bụ Lawal Musa Daura.
Cheta na ndị ọrụ nchekwa DSS wuchiri n'ụlọ ndị omeiwu taa ma gbochie ha ịba n'ime ọgba ụlọomeiwu.
Ndị ụlọomeiwu ntaa si na mpaghara ọwụwaanyanwụ ekwuola na ha ga-ejide Sinetọ Ali Ndume ma ọ bụrụ ọkọ ọbụla kọọ Ike Ekweremadu n'aka ndị EFCC.
Onye ndu ha bụ Chukwuma Onyema kwuru na Ali Ndume na-afụnye ndị EFCC ọkụ maka inyocha Ekweremadu.
Mba Ofesi:
Donald Trump bụ onyeisiala Amerịka ekwuola na mba Amerịka na mba ọbụla ha na ndị Iran na-azụkọ ahịa agaghị enwe mmekọ.
Nke a bụ maka mmachi azụmahịa ọ machiri mba Iran maka ngwaagha nuklia.
N'egwuregwu,
Onye so nwere otu bọọlụ Arsenal bụ Usmanov ekwetela ịnaara ego dị Paụnds nari ise na iri ise site n'aka ogbo ya bụ Stan Kroenke iji zụkọrọ otu Arsenal kpamkpam
Kroenke nwere pasentị iri isii na asaa ebe Usmanov nwere naanị pasentị iri atọ n'ọnụ ego Arsenal.
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:
Ihe nkiri nke taa: