BBC Pidgin ahaziela ịmaaka n'edemede asụsụ Pidgin

Ogbo anyi n'ụlọọru ntaakụkọ BBC bụ BBC Pidgin ewepụtala atụmatụ ụmụakwụkwọ nọ mahadụm dị ichieichie na Naịjirịa ga-eji maaka n'ide akụkọ n'asụsụ Pidgin.

Ndị ga-eso n'ịma aka ahụ ga-edere ndị haziri ịmaaka a akụkọ mkpụrụokwu ya si narị asatọ (800) ruo otu puku (1000) nke metụtara isiokwu "Ndi ntoroọbịa Afrịka ha dịla njikere ịchị ọchịchị." nke a ga-eziga n'akara email a [email protected] .

Ndị ga-etinye anya n'asọmpị a iji họpụta ndị akụkọ ha nwere ume si Naịjirịa, Gana na Kameron.

Ndị a nwere ndị ọkamụta, ndị ode akwụkwọ Pidgin na ndị ntaakụkọ n'ime ha.

Ha ga-ahọpụta onye mmeri na ngwụcha.

Iwu ji edemede Pidgin ga-echekwa atumatụ a. Ya bụ, onye ọbụla chọrọ ị ga n'ihu n'asọmpị a ga-ahụ na edemede ya kwụ ọto.

A ga-akpọpụta onye meriri n'asọmpị a n'ụbọchị 15 nke ọnwa Ọgọstụ nke afọ 2018.

Onye meriri ga-enwete uru, nke ị kwụrụ ya ụgwọ akwụkwọ oji aga mahadụm n'otu afọ.

Ịmaaka a malitere taa, ọ ga-emechi n'abalị abụọ nke ọnwa Seputemba.

Zigara [email protected] akụkọ gị ugbua.

Onye ndụ BBC Pidgin bụ Adejuwon Soyinka sị:

"Atụmatụ edemede na Pidgin a bụ mbụ ụlọ ntaakụkọ dịka BBC na-eme n'ụwa. E mere ihe a iji kwado edemede na Pidgin na Mpaghara Afrịka nke ọwụwa anyanwụ."

Onyeisi BBC nke asụsụ dị icheiche n'ọwụwa ọdịda anyanwụ nke Afrịka bụ Oluwatoyosi Ogunseye si:

"Kemgbe otu afọ gara aga BBC Pidgin bidoro bụ oge ezigbote ọṅụ. Nke mere ịmaaka a ga-akwado iji asụsụ Pidgin na-akparịta ụka n'etiti ndị ntoroọbịa."

Ga na BBC Pidgin ka-inwete ihe gbasara akụkọ a n'uju.