You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ụzọ ị ga-eji mee ụmụaka gị obi aṅụrị n'oge ezumike
- Onye dere ya, Jessica Nwankwo
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, BBC Igbo, Lagos
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2
Oge eruola ọzọ mgbe ndị ụmụakwụkwọ nwere oge ezumike pụrụiche maka na ọ dị ogologo.
Ụfọdụ ndị nne na nna akwadola etu ha ga-esi kpọga ụmụ ha ụlọakwụkwọ nke a kpọrọ 'Summer Lesson' mana ọ bụghị ụmụaka niile ka nke a ga-amasị.
Ọ bụrụ na ị sonyeghi na ndị ga-akpọga ụmụ ha 'Summer Lesson', lee ihe ndị i nwereike i mere ha.
Kuziere ha etu e si egwu mmiri
Igwu mmmiri bụ ụzọ ụmụ gị ga-eji megharịa ahụ ma mụta ị zọ onwe ha ma ha danye n'ime mmiri. Ọ ga-emekwa ha ka ike gwụ ha ọfụma ka ha nweike rahụ ụra ọfụma ma too ọfụma.
Gbalia kpọga ha taa.
Kuziere ha eserese nakwa nka na ụzụ ndị ọzọ
Kuziere ha etu esi agba egwu
Igbo kwenu!
O nwere egwu karịrị egwu ogene? Mba! Anyị a ga-akụziri ụmụ anyị ya? Eeeeeee
Kọrọ ha akụkọ oge gboo
Ị ma ụbọchị mbụ atụrụ ogbunigwe n'ala Igbo? Ị ma aha nwoke mbụ si n'oru tọghapụ onwe ya?
Ị nwere ike ị maata nke a ma kuzikwara ụmụ gị. Otu ụzọ ị ga-esi mee nke a bụ ị kpọrọ ha gaa n'ụlọ ngosi dị ịcheịche n'ala Igbo.
Aka-ọrụ
Kpọrọ ha gaa ebe ha ga-amụta ọrụ aka. Nke a ga-eme ha mụta aka ọrụ nwere ike ị nye ha nri n'ọdịnihu maọbụrụ na ha enwetaghị ọrụ na ngwụcha mahadụm.
Otu Ọgbọ
Na ngwụcha, ọ bụrụ na ị bụ onye omenala na-amasị nke ọma, oge ezumike ogologo a bụ mgbe i nwere ike iji tinye ha na mmanwụ maọbụ otu ọgbọ n'obodo unu.
Nke a ga-eme ka ha nwee ezigbo amamihe, akọ na uche banyere omenala Igbo nakwa n'ebe o siri ike.