Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ipob gwara ICC "Unu ekwesighị ịkpọ Buhari oku"

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ipob akatọọla ICC maka ịkpọ Buhari oku

Ndị na-achọ nnwereonwe Biafra

Ebe foto si, Getty Images

Ipob akatọọla ụlọikpe mbaụwa na-ahụ maka mpụ bụ 'International Criminal Court' maka ịkpọ onyeisiala bụ Muhammadu Buhari oku ka ọ bịa kwuo okwu n'ọgbakọ ha mere na Hague.

Ha sị na ọ bụ maka mkpọchi ntị Buhari n'ịtọhapụ onye bụbu onye ndụmọdụ nchekwa bụ Sambo dasuki, na onyeisi otu Shiites bụ El-Zakzaki agbanyeghi n'ụlọikpe ekwuola ka atọhapụ ha.

NEMA - Idemmiri ga-eme n'Anambra

Ebe idemmiri mebiri ihe na Benue

Ebe foto si, Getty Images

Ndị steeti Anambra kwesiri ịdị njikere ugbua dịka ụlọọrụ na-ahụ maka ọnọdụ gbatagbata bụ 'National Emergency Management Agency' (NEMA) ekwuola na oke idemmiri chere ha n'ihu.

Ụlọọrụ NEMA kwuru na idemmiri a ga-emetụta mpaghara ime obodo dịka Njikọka, Ayamelụm, Ọwụwa-anyanwụ Anambara, Anaọcha, Agụata, Ugwu Idemili, Ọgbarụ, Ugwu Ọnịcha, Ugwu Orumba, Ọdịda-anyanwụ Anambara, Ndịda Ọnịcha nakwa Dunukọfịa.

Gụọ akụkọ a n'uju ebe a: Oke idemmiri na-abịa n'Anambara - NEMA

Agbaala ọtụtụ mmadụ egbe na Toronto

Ndị uweojii chụpụrụ ndị mmadụ n'ogbe ahụ

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ndị uweojii chụpụrụ ndị mmadụ n'ogbe ahụ

Ndị uweojii Toronto nke mba Canada ekwuola na otu nwoke ji egbe gbagburu otu nwaagbọghọ ma merụọ mmadụ iri na atọ ahụ n'abalị ụnyaahụ.

Mgbọ egbe tụrụ ma gbagbuo nwoke ahụ dịka ụda egbe na-arị ibe ya elu.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

N'egwuregwu:

Liverpool na Dortmund

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Christian Pulisic nyere ọkpụ goolu abụọ n'asọmpị ahụ mgbe Dortmund si n'azụ merie Liverpool

Otu Borussia Dortmund si n'azụ were ọkpụ atọ asatara otu merie Liverpool n'asọmpi International Champịọns Cup ha gbara ụnyaahụ.

Ndị otu Liverpool dịka Mohammed Salah, Sadio Mane esonyeghi gbaa asọmpị ahụ.

Nkeji nke ụtụtụ a:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe Nkiri nke taa:

Aha onyonyo, Onyeoru Air Peace ji asụsụ Igbo atụziaka maka njem n’ụgbọelu si Legọọs na-aga Owere