Akụkọ ndị dị mkpa: Ekweremadu chọrọ nhatanha na nkesa ọkwa gọọmentị

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Akụkọ dị mkpa taa

Osote onyeisi sineti bụ Ike Ekweremmadu ekwuola na otu ụzọ a ga-esi kwalite udo n'ezi obibi na Naịjirịa bụ ịkekọrịta ọrụ, ọkwa dị ịcheiche nakwa ngalaba n'ụzọ dị nhatanha.

O kwuru na atụmatụ a ga-ebute udọ karịa ịkwe naanị nkwa nkịtị.

Ndị uweojii na Legọs anwụchiela mmadụ ise bụ ndị isi otu ndọrodọrọ PDP na Legọs maka ọnwụ otu n'ime ha.

Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Legos kwuru na ọ bụ ọgụ na mgba mere na nzụkọ pati ahụ riri ndụ nwoke ahụ.

N'Afrịka,

Ụzụ akwa n'atụ na mba Sawụt Afrịka ebe ndị o ji egbe egbu wakporo ma gbuo mmadụ iri n'otu bụ ndị na-anya ụgbọala tagzi.

Ndị uweojii na mba ahụ kwuru na a wakporo ha mgbe ha si akwamozu onye otu ha alọta ma kwuo na mmadụ anọ n'ime ha nọ n'ụlọọgwụ.

N'Egwuregwu,

Alex Iwobi bụ onye ọgba bọọlụ Naịjirịa na-akwado ibinye aka n'ime akwụkwọ ọrụ ọhụrụ ga-eru afọ 2022 n'otu Arsenal.

N'otu aka ahụ otu Leicester city ajụla ịtọghapụ Ahmed Musa ka o sonye n'otu Al Nasr nke Sawudi Arebịa.

Gee nkeji nke mgbede a:

Ihe onyonyo nke taa: