You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ala Igbo ebutela esemokwu n'etiti nwaanyị na nwoke
Juliet Kego Ume-Onyido bụ aha nwaanyị bidoro okwu a n'elu akara twita ya. Akụkọ a adọtala ndị abụghị ndị Naịjirịa n'ime ya.
O kwuru sị "dịka m bụ nwaanyị n'ala Igbo, enweghi m ike ị nwe ala ebe ọ bụla n'ala Igbo n'enweghi enyemaka nwoke n'ezinaụlọ m"
Etu ndị mmadụ siri saa okwu a gosiri na ọ bụ ihe dị n'uche ndị mmadụ mgbe niile.
Otu onye bu @Nekem kọwara ahụmihe ya mgbe erere ala nna ya nwụrụ anwụ.
@NnaEnibe kwuru na ihe na-ebute nke a bụ di a na-eche na nwaanyị kwesiri ị lụ.
@mykel_rechard na-akọwa na ọ bụ omenala adabaghị adaba na ebute nhatanha nke a.
Ọ bụghị kwa mmadụ niile kwenyere na okwu a dịka @aikmamah siri kwuo n'uche ya.
@aikmamah kwuru na ọ dịghị mma ị kwu na ọ bụ ebe niile n'ala Igbo ka nke a na-eme.
Onye ọzọ ekweneyeghị na okwu a bụ @Obedng, ọ sị na kemgbe oge gboo nwaanyị n'ala Igbo nwere ikike ị zụ ma rekwa ala.
@Ezbaronkings kwuru na ọ bụ sọsọ ejighị ego bụ ihe ga-akwụsị onye ọbụla ma nwaanyị ma nwoke ị nwe ala.
Cheta na ụlọịkpe kachasị n'ala Naịjirịa manyere iwu n'afọ 2016 ka ụmụnwaanyị nwee ikikere ị rite ala na akụnaụba ndịọzọ n'aka nna ha.
Ị chere na iwu a ga-ekwe omume?