Akụkọ dị mkpa n'ịchafụ: Amanyela Facebook iwu ikwụ pound 500,000
Akụkọ ndị dị mkpa.
Buhari akatọọla ndị na-ata ya ụta

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Mohammadu Buhari akatọọla okwu ụfọdụ ndị ndọrọndọrọ ọchị na-ekwu na ọgbara nkịtị n'ihe gbasara ogbugbu ndị mmadụ na Naịjirịa.
Buhari kwuru nke a n'ọgbakọ ndọrọ ndọrọ ndị APC mere n'Ekiti Steeti ụnyaahụ iji kwado kayode Fayemi ịbụ gọvanọ steeti ahụ.
Ụka Angịlịkan adụọla Buhari ndụmaọdụ

Ebe foto si, Anglican communion
Ndị ụka Anglican nke Nnewi Dayọsis agwala onyeisiala Buhari ka o chegharịa echiche n'atụmatụ ya ị pụtagharị n'ọkwa ọzọ.
Nke a dị n'ozi ụkọchukwu Godwin Okpala wepụtara kwuo na ụfọdụ na-ahụ ya dịka ogbunigwe nchere oge.
United Kingdom ga-eri Facebook iwu

Ebe foto si, Getty Images
Ngalaba na-ahụ maka nchekwa data na United Kingdom ga-eri ụlọọrụ Facebook iwu ego ruru paụnds puku narị ise maka ị da iwu nchekwa data
Kọmishọna na-ahụ maka ozi kwupụtara nke a mana ụlọọrụ Facebook kwuru na ha ga-asa okwu n'oge na-adịghị anya.
Egwuregwu:

Ebe foto si, Getty Images
Gee nkeji nke ụtụtụ a:
Ihe onyonyo nke taa:











