You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
#Nigerianlivesmatter: Ndị na-eme ngagharịiwe wakporo Unity Fountain
Ụmụafo Naijiria na ndị na-alụ ọgụ maka ikike dịrị onye pụtara n'igwe na Unity Fountain dị n' Abuja taa igosi iwe ha banyere oke ogbugbu mmadụ na-eme n'akụkụ Naijiria dị iche iche.
Ha kpọrọ onyeisiala Muhammadu Buhari oku ka o me ngwa ngwa kwụsị oke nkwafu ọbara na-eme na Platu, Benue, Taraba, Kaduna, Zamfara na ebe ndị ọzọ.
Ha gwakwara ya ka ọ hazigharịa ndị ọrụ nchekwa ala Naijiria.
N'okwu ya, onye otiegwu a ma ama bụ Charly Boy kwuru na ihe ha bịara Unity Fountain ime bụ ịgwa gọọmenti na 'oke ogbugbu mmadụ ahụ ezuola, na iberibe ndị \naijiria ezuola.'
Otu onye n'ime ha bụ Gbenga Sesan kwuru n'igwe okwu Twitter ya na ngaghariwe ahụ bụ iji tie mkpu ka oke ogbugbu mmadụ ahụ kwụsị.
Lee ihe ndị ọzọ soro gaa ebe ahụ na-ekwu maka ya na Twitter:
Lawal Lateef kwuru na "naani ihe anyị na-arịọ bụ kwusị oke ogbugbu mmadụ."