You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Mara ihe na-eme n'ikpe Shell na Eni bidoro ọzọ taa
Ikpe dị n'etiti ụlọọrụ abụọ na-arụpụta mmanụ agbịdị bụ SHELL na ENI na gọọmentị Naịjirịa ebidola ọzọ n'obodo Milan nke mba Itali
Tupu o bido taa, e bugharịrị ụbọchị mbido okwu ugboro abụọ; Maachị na Mee.
E boro ndịọrụ ruru itoolu ndị SHELL na ENI ebubo na ha nyere aka azụ n'ọzụzụ onunu mmanụ agbịdị ha zụrụ n'afọ 2011.
Ma n'ebo ahụ kwa onye bụbu Mịnịsta na-ahụ maka mmanụ agbịdị bụ Dan Etete na-aza ebubo na o ji aghụghọ mefuo ego kwesiri iru Naịjirịa aka.
Mmadụ niile a kpọrọ aha n'okwu a na-agọ na ha emeghị ihe ọjọọ ọbụla.
Lee ihe ndị dị mkpa ị kwesiri ịma maka okwu a:
Mgbe o bidoro
Na afọ 2011, Shell na Eni kwuru ihe ruru otu ijeri dọla na ụma iji zụrụ onunu mmanụ agbịdị kachasị nnukwu na ọdịda anyanwụ Afrịka.
Ha kwụnyere ego a n'akara ụlọakụ Naịjirịa n'obodo London mana o ruteghị Naịjirịa aka.
Nyocha e mere chọpụtara na Mịnịsta na-ahụ maka mmanụ agbịdị bụ Dan Etete jịrị aghụghọ mefuo ego ahụ n'iji ụlọọrụ o nwere na nzuzo bu 'Malabu Oil & Gas' were ya bụ ego.
Ndị a kpọrọ aha na ihe eboro ha
Onyeisia Eni bụ Claudio Descalzi, onye bụbu onyeisi Shell Marcus Brinded na mmadụ iri n'otu na ụlọọrụ abụọ bụ ndị a kpụpụrụ ụlọịkpe.
Gọọmentị ala Naịjirịa na-ekpe ndị ọrụ Shell na Eni ruru itoolu na Etete bụbu Minista na-ahụ maka mmanụ agbịdị maka nrụrụaka, ịna aka azụ na igwu gọọmentị Naịjirịa chandum.
Ndị a niile ekwuola na ha emeghị ihe ọjọọ ebe Shell na Eni kwuru na ha amaghị na ego ha kwuru agaghị erute gọọmentị Naịjirịa aka.
Etu ihe si kwụrụ ugbua
Dịka e bugharịrị okwu a ugboro abụọ, taa bụ Juun 20 bụ mgbe ikpe bidoro n'ezie.
Ụlọịkpe ahụ ga-enye kwa ndị ọzọ chọrọ isonye n'ikpe ohere ịbịa kwuo ihe a ga-eji nabata ha n'ime ikpe a.