You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Wilshere apụọla na Arsenal
Akụkọ ndị dị mkpa
Ọgbakọ ụmụ nwaanyị Abia steeti arịọla ndị uweojii na steeti ahụ enyemaka ịkwụsị mpụ na ihe ojọọ dị ịcheiche a na-emeso ụmụnwaanyị kachasị ụlọ na-agba mgbere nwa ọhụrụ.
Nkechi Ikpeazụ nwunye gọvanọ na-achị Abia kwuru na ịgba akụwụna, mwakpo n'ike na ịmegbu ụmụnwaanyị ajadu so na ihe ndị ekwesiri ịleba anya ma kwụsị kwa.
Ọzọ,
Gọọmentị etiti eweputala atụmatụ isii ha kwuru na ọ bụ ị ji kwusi nsogbu dị n'etiti ndị ọchịehi na ndị ọrụ ugbo na Naịjrịa.
Cheta na kemgbe mbido afọ 2018, okwu a eriela ndụ mmadụ narị ole na ole kachasị na Benue steeti.
N'akụkọ ofesi,
Mba Amerịka esila n'ọgbakọ oke na ugwu ruru mmadụ na UN a kpọrọ United Nations Human Rights council na bekee pụọ.
Nikki Haley bụ onye nọchitere anya Amerịka na UN kwuru na nzụkọ ahụ dị aghụghọ ma na-akpa agwa ihu mma abụọ.
N'egwuregwụ,
Ka asọmpị iko mba ụwa jisike na-aga, Jack Wilshere bụ aha a ma ama n'otu egwuregwu bọọlụ Arsenal ekwuola na ya ga-ahapụ otu ahụ na ngwụcha ọnwa Juun.
O depụtara nke a n'elu Instagram ya na oge eruola ọ ga-eji chọrọ ụzọ ọzọ n'ọrụ aka ya bụ ịgba bọọlụ.
Gee nkeji ụtụtụ ebe a