Akụkọ kachasị na-ụtụtụ a: ụmụ Naịjirịa juru nga n'Itali

Ụmụ Naịjirịa 1500 nọ na nga Itali

Onye nnọchite anya mba Itali na Naịjirịa bụ Stefanou Pontesilli, ekwuola n'ihe ruru mmadụ 1500 bụ ndị Naịjirịa nọ na mkpọrọ na mba ha.

Stefanou Pontesilli gwara ndị nta akụkọ nke a ụnyaahụ n'Abuja.

Ohaneze ndị Igbo ekwuola na nhazighị ọchịchị Naịjirịa bụ ma ihe adị mma

Onyeisi Ohaneze ndị Igbo bụ Nnịa Nwodo ekwusiele ike ọzọ na nhazigharị Naịjirịa bụ naanị ụzọ a ga-esị kwọọ ya bụ onye ukwu wara ka ije wee kwe ojịje.

Nwodo kwuru nke a na Legos mgbe ha bịara ihibe ndị isi Ohaneze ndị Igbo n'ebe ahụ.

Ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa ga-eke nkwcha

Gọọmenti Naịjirịa akpọkuola ndị ọrụ nchekwa ka ha kee nkwucha pụrụiche n'ọdọụgbọelu na ụzọ ndị ọzọ e sị abata obodo a.

Oku a dị n'akwụkwọ ha degara ndị isi otu na-ahụ maka nchekwa njem ụgbọelu na Naịjirịa

Ọkara nke iko mba ụwa

N'egwuruegwu Iko Mbaụwa agbara ụnyaahụ Ịnglandị ji ọkpụ abụọ goolu abụọ asatara otu merie ndi Tunishia.

Kane ndị Ịnglandị tinyechere goolu abụọ ahụ.

Gee akụkọ anyị n'otu nkeji

Lee ihe nkiri anyị