You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Aka akparala nwaanyị chọrọ iji ogbunigwe egbu ndị mmadụ
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1
Ndị agha nchekwa Naịjirịa akpọrọ Operation Lafiya Dole kwuru na-anwụchiri otu nwaanyị yi uwe ogbunigwe baa n'ụlọ ndị alakụba dị na Gashua Yobe Steeti n'isi ụtụtụ taa.
Anwụchiri nwaanyị a dịka ọ na-achọ ịgbapụ ogbunigwe ahụ mgbe ndị a na-achọ ikpe ekpere ụtụtụ.
Ozi a dị n'akwụkwọ osote onụ na-ekwutere ndị agha Naịjirịa bụ Col. Onyeama Nwachukwu wepụtara.
N'okwu ya "Nwaanyị a batara n'ụlọ ndị alakụba mgbe ha chọrọ ịmalite ekpere, n'atufughi oge ndị a nwuchiri nwaanyị ahụ ma nyefe ya n'aka ndị agha nọ n'Azare."