Ị chọrọ ịma etu e si esi ojoko awayị? Lee ya ebe a

Ọtụtụ ndị mmadụ na-enwe mmasị iri ojoko chara acha, mana ha amaghị na ojoko achaghị acha bụ ebe ejedebere ma ọ bụrụ ma e sie ya ọfụma.

Ojoko 'abịrịka' maọbụ 'ogede' achaghị acha bụ ezi nri na-edozi ahụ.

Dịka ndị ọkachamara n'ihe gbasara nri na ihe ha na-enye n'ahụ siri kọwa, ojoko na-enye ọbara, potassuim, fibre na Vitamin dị icheiche.

Ngwa eji ezi ojoko awayị

1. Ojoko achaghị acha (aka anọ)

2. Azụ ọkpọ (otu maọbụ abụọ)

3. Ụgụ

4. Mmanụ (ngazi ofe abụọ)

5. Ịsha (otu iko mmiriaraehi)

6. Ose (mkpụrụ ose iri)

7. Ogiri Igbo maọbụ ogiri bekee maọbụ ha abụọ (otu obere ngazi/ otu mpekere)

8. Yabasị (otu maọbụ abụọ)

9. Nnu

Etu ị ga-esi sie ya

  • Were mmiri ọkụ saa azụ ọkpọ ahụ, wepụ ọkpụkpụ niile dị na ya ma tinye n'ime ite dị ọcha.
  • Mecha ojoko ahụ ma bee ya kịrị kịrị , saa ya mmiri ma tinye ya n'ime ite ahụ itinyerela azụ
  • Gwerie ịsha, ose, yabasị na ogiri ma tinye ha n'ite ahụ
  • Tinye mmanụ, nnu na ogiri bekee (ma ị chọọ)
  • Gbanye nwa mmiri n'ite ahụ. E kwela ka mmiri karịa ojoko ahụ
  • Donye ite gị n'oku ma sie ya ihe ruru nkeji iri na ise.
  • Tinye akwụkwọ nri i biri ebi
  • Gbaghaa ya bụ nri ma fọtuo ite gi ozigbo!

O ghela! Weta efere na ngazi gị