You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ kachasị taa: Okonjo-Iweala 'A gaghị m emechi ọnụ maka mpụ'
Akụkọ ndị dị mkpa n'abalị a:
Ngozi Okonjo-Iweala ekwuola obi ya mbanyere mpụ
Onye bubụ mịnịsta na-ahụ maka ego bụ Ngozi Okonjo-Iweala ekwuola na ọ gaghị emechi ọnụ n'ibu agha megide mpụ
N'ajụjụ ọnụ ndị BBC Focus on Afrịka gbara ya, Ngozi na ọ bụ ibu agha a mere eji tọọrọ nne ya n'afọ 2012.
Ụlọikpe Suprim atọhapụla onye so n'akụkọ Otokoto
Ka afọ iri abụọ na abụọ gachara, ụlọikpe Suprim atọhapụla Alban Ajaegbu so na ndị ekwuru gburu otu nwata n'owerri.
Cheta na Otokoto na ndị otu ya ọzọ gburu Ikechukwu okoronkwo n'afọ 1996.
Akụkọ ofesi
Ihe ruru mmadụ iri anwụọla dịka a gbara egbe n'otu ụlọakwụkwọ dị na Houston Texas
ndị uweojii kwuru na ndị a nwụrụ karịrị n'ụmụakwụkwọ, ebe anwụchiela otu nwata akwụkwọ n'ihi nke a.
N'Egwuregwu
Ndị Super Eagles na otu Atletico madrid ga-agba asọmpị enyi na eny n'abalị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Mee a.
Nke a ga-adị n'ọgbọ egwuregwu Gods Will Akpabio dị n'Uyo, iji jikere ndị Super Eagles n'asọmpị iko mba ụwa.
Gee ya nkeji nke abalị a:
Ihe onyonyo nke taa: