You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ kachasị taa: Buhari akatọọla ọnwụ ndị Fada na Benue taa
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:
Ndị uweojii n'Enugwu na-emebi ogbunigwe echi
Ndị uweojii n'Enugwu ekwuola na ha ga-emebi ogbunigwe a chọpụtara liri n'ala site n'oge agha.
Akwụkwọ onye nkwuchiteọnụ ndị uweojii na steeti ahụ kwuru na ha ga-ebido imebi ogbunigwe ahụ echi.
Ndị ọchịehi egbuola ụkọchukwu abụọ na ndị ọzọ
Onyeisiala Muhammadu Buhari akatọọla ogbugbu e gburu ndị ụka Katọlik na Benue taa.
Ndị ochiehi wakporo ụlọụka St Ignatius nke ndị katọlik wee gbuo ndị fada abụọ ndị na-aka ụka ebe ahụ.
Akpọrọla Dino gawa Lokoja
Okwu dị n'etiti ndị uweojii na Sinetọ Dino Melaye abala agba ọzọ.
Ndị uweojii kpọrọ Melaye gawa Lokoja taa, ihe ndị mma na-ajụ bụ ma a ga-akpọgharị ya n'etiti ndị ohi?
Na mba ofesi
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump adọọla mba Iran aka na ntị gbasara ngwọagha nuklia.
Trump bụ onye na-ele onyeisi mba France bụ Emmanuel Macron ọbịa kwuru na nnukwu nsogbu ga-adịrị Iran ma ha bidogahrịa imepụta ngwọagha nuklia ọzọ.
N'egwuregwu
Liverpool ga anabata ndị AS Roma taa n'asọmpi ọkara ikpeazụ Uefa Champịọns ụkwụ nke mbụ ya.
Mohammed Salah nke Liverpool ga-enwe ohere izute ndị AS Roma bụ ebe ọ gbaburu bọọlụ n'oge gara aga.
Nkeji nke mgbede a
Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji.
Ihe onyonyo taa
Nwaanyị mụrụ ejima atọ mana ọ maghị ebe di ya nọ kamgbe ọnwa Disemba afọ 2017.