You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nwoke gba ọtọ awakpoola ụlọoriri na mba Amerịka
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1
Ndị uweo ji kwuru na otu nwoke gba ọtọ egbuola mmadụ anọ n'ụlọoriri dị n'obodo Nashville na mba Amerịka.
Nwoke ahụ tibara n'ime ụlọoriri ahụ ebe elekere asatọ nke ụtụtụ n'Antioch ma malite ị gba ndị mmadụ egbe.
Mmadụ anọ ndị ọzọ merụkwara ahụ tupu onye ọzọ na-eri nri ebe ahụ anapụ ya egbe oji, o we gbapụ ọsọ.
Ndị uweoji enyela aha nwoke ahụ ka Travis Reinking dị afọ iri abụọ n'itoolu bụ onye si obodo Illinois ebe ha jisiike na-achọ ya.
Akụkọ ga-amasị gị