You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Okporo mmanụ agbawala n'Ipaja nke Legọs
Otu okporo mmanụ dị na ogige Peace Estate nke Baruwa dị n'Ipaja Legọs Steeti, a na-eche na ọ bụ ndị mmadụ kụwara, agbawala ma baa ọkụ.
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii nke Legọs Steeti bụ Chike Oti gwara BBC Pidgin na nke abụ eziokwu.
O kwuru na site na nyocha ha mere, a na-eche na ọ bụ otu onye ji ọkụ gaa n'ime ọhịa ebe okporo mmanụ NNPC na-ehifu ehifu butere ọkụ mgbawa ahụ.
Oti kwuru na okporo mmanụ a na-ehifu ehifu kamgbe , nke bụtere mmetọ na mmerụ mmiri dị na gburugburu ebe ahụ.
Akụkọ ga-amasị gị:
O kwuru na ha anụbeghị maka onye nwụrụ ma ọ bụ merụrụ ahụ na mgbawa okporo mmanụ ahụ, ebe nyocha ka na-aga n'ihu.
BBC gbara mbọ inweta ndị ụlọọrụ na-agbanyụ ọkụ bụ Fire Service n'olu bekee ma na ha enweghị azịza gbasara ya.
Mana ndị mmadụ bị gburugburu ebe ahụ kọwara okporo mmanụ gbawara n'ezie, dịka ọtụ onye dere ya n'akara tuwitta.