You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Praịm Mịnịsta mba Briten bụ Theresa May akwala arịrị
Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:
Praịm Mịnịsta mba Briten bụ Theresa May akwala arịrị
Praịm Mịnịsta mba Briten bụ Theresa May akwala arịrị na aka Yunịated Kindom dị n'asị akpọrọ ndị na-enwe mmorịkọta nwoke na ibe ya nakwa nke nwaanyị na ibe ya.
Cheta na mba Naịjirịa na Yuganda so na ndị nyere iwu megide ụdị mmekọrịta ahụ, agbanyeghị ọgụ a na-alụ ịkwụsị ya.
Ndị omeiwu Sineti akpọọla ndị Mịnịsta oku
Ndị Sịnetị agwala Mịnịsta na-ahụ maka nchekwa bụ Mansur Dan-Ali, Mịnịsta na-ahụ maka ego bụ Kemi Adeosun na Onyeisi CBN bụ Godwin Emefiele ka ha wụchie n'ihu ha.
Oku a bụ maka ego dị nde dọla narị anọ iri isii na abụọ ha jiri zụo ụgboelu Helikọpta nke ndị Sịneti na-akwadoghị.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:O
Onyeisiala Buhari enyela ọkaiwu Keyamu ọrụ ọhụrụ
Onyeisiala Mohammdu Buhari akpọpụtala Onye ọkaiwu bụ Festus Keyamo(SAN) dịka onye na-echute ọnụ ya n'ihe ndọrọndọrọ ọchịchị nke 2019.
Keyamo n'akara tuwita ya dere na ọ ga-enye nzaghachị maka nke a n'oge dị n'ihu.
N'egwuregwu
Eriela onye na-agbara Chelsea bọọlụ ebe azụ Marcos Alonso iwu maka ịme ihe ike megide Shane Long nke Southampton
Otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ na Ingland bụ FA kwuru na ọ gaghị agba asọmpi ha nwere n'ụbọchị ụka na-abịa abịa.
Nkeji nke mgbede a
Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji.
Ihe onyonyo taa
Chibuike Josh Alfred a na-akpọ Josh2Funny bụ onye ọkpaọchị kọwara etu o jiri bido ịkpa ọchị.