You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Buhari adọtịala ụbọchị nkwupute ihe onye nwere
Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ekwuola ka a dọtịa ụbọchị eji emecha nkwuputa maka ihe onye nwere na ụtụisi.
O kwuru ka ewega ya n'ụbọchị iri atọ (30) nke ọnwa Juun, site n'ụbọchị iri atọ na otu (31) nke ọnwa Maachị ọ kwesịbụrụ ịgwụ.
Onye ndụmọdụ onyeisiala Naịjirịa puruiche n'ihe gbasara akụkọ na mgbasa ozi bụ Femi Adesina kwuru na Buhari kabiri iwu ngalaba na-ahụ maka ntụkọta ego ala Naịjirịa a kpọrọ 'Federal Inland Revenue Service' na bekee mana o kwukwara na a naghị a dọtị oge a ọzọ.
Cheta n'ime ọnwa Dizemba, onyeisi ụlọọrụ FIRS bụ Babatunde Fowler kwuru na ụtụisi a nyere Naịjirịa ijeri naira iri na asaa n'etiti ọnwa Juun na Dizemba n'afo 2017.
Adesina kwuru n'ime akwụkwọ-ozi a nyere ndị ntaakụkọ na gọọmentị mmere nkpebi a makana ha nwere olileanya na ọtụtụ ndị mmadụ ga-ekwupute ihe ha nwere.
N'ọnụokwu Buhari: "ọ dịghị mma na Naịjirịa anaghị eme ọfụma na ihe gbasara ụtụisi na Afịrịka."