Dapchi anabatala ụmụakwụkwọ Boko Haram tọọrọ mbụ

Ụmụakwụkwọ Dapchi ruru otu narị na ise ndị Boko Haram tọghapụ n'izuuka a alaghachiala Dapchi.

Nne na nna ha na ndị obodo Dapchi putara n'ịrọ ịnabata ha.

Onye ntaakụkọ BBC Chris Ewokor kwuru na aṅụrị juru ebe niile mgbe a hụrụ ndị ụmụakwụkwọ a.

Mana egwu ka dịkwa makana ndị Boko Haram dọ ndị ụmụakwụkwọ a aka na ntị sị ha alaghachịla ụlọakwụkwọ ọzọ.

Nke a na-ebute nnukwu egwu n'obodo ahụ.

Ihe ọzọ na-abute egwu bụ otu nwaakwụkọ n'ime ha bụ Leah Sharibu ka nọ n'aka ndị Boko Haram.

Ndị Boko Haram ka ji Sharibu makana o kwuru na naghị agọ okwukwe ya n'ime Christ.

Udo ọbịala Dapchi?

Cheta na akụkọ pụtara ụbọchị ole na ole kwru na ebe niile dara jụụ n'obodo Dapchi maka egwu na-atụ ndị mmadụ maka na ha nwetara ozi na ndị Boko Haram na-abịa obodo ha.

Akụkọ ga-amasị gị: