You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akwa adaala na Miami
Otu akwa di na mahadum akpọrọ Florida International University na bekee nke mba Amerike adaala.
Akụkọ na-ekwu na akwa nke a dakwasịrị mmadụ ole na ole mana ọnụọgụgụ nke ezie apụtabeghị.
Ndị ọrụ nzọpụta na-arụ ọrụ ugbu a ịzọpụta ndị na no-okpuru akwa a.
Ha na-arịọ ndị mmadụ ka ha sị okporo ụzọ ọzọ na-aga ebe ha na-aga.
Ọ bụ ndị ụmụakwụkwọ na-aga mahadum Florida bụ ndị riọ arịrịọ ka ha rụọ akwa nke a maka n'ime ọnwa ọgọstụ n'afọ 2017 otu nwaakwụkwọ ibe ha nwuru mgbe ọ na-achọ ị gafe ụzọ a.
Akụkọ ka nna-abia.