You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ndị na-achi ehi egbuola mmadụ 27 na Kogi
Ndị ji egbe, a na-ebo na ha bụ ndị ochịehi, egbuola mmadụ iri abụọ na ise na Kogi steeti.
Ọ bụ obodo Oganienugwu, Ikende na Abejukolo n'ime Kogi ka mkpamkpa a mere.
Akụkọ kwuru na ọtụtụ mmmadụ na-agba ọsọ ndụ makana ha na-atụ egwu na ndị a jiri egbe ga-alaghachị azụ.
Ugbu a ndị uwe ojii na ndị agha agaala ebe a ahụ ịme ka udo laghachịta.
Ndị hụrụ ihe mere gwara ndị nta akụkọ na a jiri mma magburu ọtụtụ n'ime ha.
Ha kwukwara na ndị a bidoro ogbugbu ha na ugbo tupu ha bata obodo n'ime abali.
Onyeisi ndị uweojii bụ Monday Bala na steeti ahụ kwuru na ọmaghị mmadụ ole nwuru n'eziokwu.