You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
N'Enugwu: Gwongworo adachiela ụzọ Onyeama
Ihe mberede okporoụzọ ahụ mere Ụnyaahụ oge gwongworo bu mmanya sitere n'ọdụ mmanya dị na 9th Mile na nke ka na-aga 9th Mile Kilo tara isi ọnụ wee kurisia mmanya kariri otu puku 'crate' na okporo korota.
Kemgbe ọdachi a mere, ndị na-eme njem nọzi na nsogbu n'ihi na ọ bụ nanị otu okporoụzọ ka ha na-agbazi.
Ndị akaebe nọ mgbe ya bụ ọdachi mere kwuru na onweghị onye nwụrụ anwụ, nanị mmerụahụ ka onye ọkwọụgbọala na onye ọrụ ya merụrụ.
Ndị ụgbọala kwara arịrị na kemgbe ọdachi ahụ mere na ha na-atazi nnukwu ajụjụ iji rue ebe ha na-aga.
Mgbe onye ntaakụkọ anyị no n'ebe ihe a mere ụnyahụ, ndị nwe ya bụ ụgbọala nakwa mmanya dị n'ime ya na-arụsi ọrụ ike ka ha bupụsịa mmanya ndị dị mma nakwa ndi kụwara akụwa n'ụzọ, ebe ndị ọrụ 'Road Safety' nọkwa na-elekọta gburugburu ahụ ihe mberede mere.