You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Boko Haram e gbuola mmadụ ato na ọkara Cameroon
Akụkọ si na ụgwụ hausa dị na Naijịria na-ekwu na ndị ọrụ enyemaka atọ na ndị gbara ọsọ ndụ na ọkara Cameroon akpọrọ Rann.
Ha nwuru maka mwakpo ndị Boko haram.
Ndi Boko haram gbukwara ndị nche atọ ma tọrọ ọtụtụ ndị mmadụ.
Onye ntakụkọ BBC akporọ Chris Ewokor kwuru na ndị mwakpo a ji ụgbọala na ọgba tum tum wee wakpo ụlọ ndị agha Naijiria dị n'ọkara Naijirịa na Cameroon.
Ọ sị na ọ bụ onye ọrụ UN akpọrọ Edward Kallon kwuputere nke a .
O nwebeghi ihe ndi agha Naijiria kwugoro gbasara ihe mwakpo a mana akukọ na-ekwu na egburu ndị nchekwa ato na-elekota ụlọ ndị gbara ọsọ ndụ.
Amaghị mmadụ ole n'ime gbara ọsọ ndụ ihe a metutara.
Rann bụ obele obodo dị na Naijiria dị n'ọkara Cameroon ebe ndị
Na ọnwa Janụarị 2017,ụgboelu ndi Niaijiria turu ogbunigwe gburu mmadụ nari otu,iri na ise n'ụlọ ndị a gbara ọsọ agha maka na ha che na ọ bụ ụlọ ndị Boko haram.
Ndị Boko haram a malitela n'ike na nso nso a, nagbanyeghi na ndi agha Naijiria na e merie la ha.