You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Dino Melaye: APC na Buhari agbajọọla ndị Naijịrịa
Onye otu Sineti akpọrọ Dino Melaye kwuru na Pati ya bụ 'All progressives Congress' a gbajọọla ndị Naijiria.
Melaye kwuru na APC emeghị ihe ndị Naijiria tụrụ anya n'aka ha, ka ọtụtụ ndị gbara mbọ hụ na ha tunyere Onyeisiala Najirịa bụ Buhari na ntụliaka e mere na 2015.
Onye omeiwu a si na kogi steeti kwuru nke a ụbọchị Toosde gara aga mgbe ọ na-anata nturugo 'onye omeiwu kachasị mma n'afo 2017' nke akwụkwọ mgbasa ozi akpọrọ 'Daily asset Newspaper' nyere ya.
Melaye onye kọwara APC dịka ebe mkpesa akpọrọ 'Public Complaints Commission' n'olu bekee, kwuru na Naijịrịa na-arịa ahụ.
"I kwuo eziokwu, ị nwuọ, ị tụọ asị, ị nwụọ. Mụnwa bụ Dino Melaye ekpebiela ikwu eziokwu ma nwụọ."
O kwuru na ndị Naijirịa na-ata ahụhụ na-achị ọchị.
O kwukwara n'ọdị mkpa ka ndị a na-achị na-enyocha ihe ndị nọ n'ọchịchị na-eme.