You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ngwa ahịa agbaala ọkụ n'Alaba International
Ọkụ agbaala ụlọ ngwa ahịa anọ akpọrọ warehouse n'olu bekee n'Alaba International.
Onye hụrụ n'anya nọ mgbe ihe mberede a mere akpọrọ Chinedu kwuru na ọkụ a bidoro n'elekere anọ nke mgbede a.
Ọ sị na tupu ụlọ ọru na-ahụ maka mmenyụ ọkụ abiaghị n'oge.
Ọ sị na n'ime ụgbọ ha atọ biara imenyụ ọkụ ahụ, otu ebughị mmiri.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:
Chinedu kwuru na onweghị onye meruru ahụ maọbụ onye ọkụ gbagburu karia ma ọtụtụ ngwa ahia gbaara ọkụ.
Ọ sị na oruru ihe karịrị 'container 40 feet' iri n'ime ụlọ ngwa ahịa ahụ.
Chinedu gwara BBC Igbo na ọ bụ ndị China nwee ya bụ ụlọ ngwa ahịa.