Queen Elizabeth II: Ndị isi mbaụwa "na-echeta Ezenwaanyị dịka onye obi ọma"

Ebe foto si, 10 Downing Street
- Onye dere ya, Tiffany Wertheimer
- Ndị mere akụkọ a, BBC News
Ekene iti aka n'obi ndị isi mbaụwa na-abata n'ike n'ike maka ọnwụ Ezenwaanyị Elizabethe nke abụọ bụ onye nwuru mgbe ọ gbara afọ 96.
Ha na-aja ya mma maka ntachiobi ya nakwa uchu ya, yana obi sara sara na obi ebere ya.
Onyeisi mba France bu Emmanuel Macron kọwara Ezenwaanyị dịka "onye nwere obi ọma" bụkwa "enyị ndị France".
Onyeisiala Joe Biden nke Amerịka na Ezenwaanyị hụrụ afọ iri anọ gara ga sị na ọ bụ "Ezenwaanyị pụrụiche - mere ka oge ya dị iche".
Na ncheta njem ọ mere n'UK n'afọ 2021, Biden kọwara Ezenwaanyị sị "o ji amaihe ya jigide anyị, jiri obi ebere ya jide anyị, mekwaa ka amamihe ya rute anyị aka".
" Ezenwaanyị Elizabethe nke abụọ bụ Ezenwaanyị mere ka ịdịnamma ndị UK na Amerịka tọọ atọ"

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala ndị China bụ Xi Jinping sị na "enyela ndị Briten ezigbo ekene itiaka n'obi maka ọnwụ Ezenwaanyị". "Ọnwụ ya bụ ezigbo ihe ụfụobi dịara ndị Briten".
Canada - ebe Ezenwaanyị Elizabeth bụbu onyeisia enweela enweela Praịm Minista iri an abụọ n'ihu ya.
Justin Trueau, onye ya bụ ọnwụ meturu n'obi, onye ma Ezenwaanyị na nwata mgbe nna ya bụ Praịm Minista sị na " ọ nwere ihunanya miriemi maka ndị Canada".
"N'ụwa a ihe niile gbagwojuru anya, umeala ya mere ka obi daa anyị jụụ," Praịm Minista ha kwuru, na ya nkata ha, ezigbo echiche, ịkpa ụkaọchị ya ga-akọ ụkọ na ndụ ya".
"Ọ bụ onye kacha amasi m n'ụwa, Ọ ga-akọ ụkọ na ndị m".

Ebe foto si, Getty Images
"Ọ bụ mmadụ puruiche"
E wedatara ọkọlọtọ n'ọtụtụ mba nke gụnyere ụlọọrụ European Commission na Brussel dịna Belgium.
Onyeisi oche ndị EU bụ Ursula von der Leyen otu Ezenwaanyị na ndị ọgbọ ọbụla si emekọrọta gosiri na ọ bụ ezigbo onye ndụ".
Ezenwaanyị Margrethe abụọ nke Denmkark, onye bụịzị nwaanyị ji ọchịchị dị oyu ahụ n'ụwa degaara Eze Charles akwụkwọ itiaka n'obi.
"Ọ bụ ọkwụrụ ọkarịcha n'ụmụnwaanyị bụ Eze bụrụkwa onye onye anyị na-elegara anya", ka o kwuru.
Ọ kọwara ọchịchị Ezenwaanyị dị afọ 70 dịka ọchịchị puruiche ma taakwa akpụ nwekwaa ihe ngosi ọ mepụtara.
Eze Willem-Alexander nke Netherlands bụ nwa nwanne Ezenwaanyị sị na ya na Ezenwaanyị Maxima ji "ezigbo nkwanyeugwu" na "amamihe miriemi" echeta Ezenwaanyị.
Eze ndị Sweden, Karl XVI Gustaf sịkwa na agbụrụ Ezenwaanyị sị "ọ na-aza oku mgbe ọbụla akpọrọ ya bụrụkwa ezigbo onye njịkọ n-ezinaụlọ ha.
Eze ndụ Belgium bụ Phillippe na Ezenwaanyị ya bụ Mathilde sị na ọ bụ "ọpụrụiche na nwaanyị' bụ onye gosiri nkwanye ugwu, obiike na uchu".
Chancellor mba Germany bụ Olaf Scholz sị na ọ, "akpa ụkaọchị dị egwu", ma sịkwa na ya agaghị echefu mbọ ọ gbara iweta udo n'etiti Britain and German mgbe a lụchara agha mbaụwa nke abụọ".
Onyeisiala mba India bụ Prịam Minista Narendra Modi "chetere ugboro abụọ ọ chọgara Ezenwaanyị n'UK.
Ọ dere n'akara Twitter ya sị, "e chitere obiọma ya na ezi nnabata ya". "Otu mgbe m gara ebe ahụ, o gosiri m hakachifu Mahatma Gandhi ji nye ya onyinye mgbe ọ gbara akwụkwọ. A gaghị echefu ya ngwangwa".
Onyeisiala mba Saudi Arabia bụ Salman na Crown Prince Mohammed bin Salman zịgakwara ozi ha ebe ha kọwara Ezenwaanyị ka "onye ndụ kwesiri ịlegara anya a agaghị echefuechefu".

Ebe foto si, Getty Images
'Ọnọdụ ya na-agba ume'
Dịka onyeze chịrị afọ iri asaa, Ezenwaanyị Elizabeth hụrụ ọtụtụ gbanwe n'usoro ihe nke ị ga-ahụta n'ozi ndị mmadụ na-ezite ụgbua ọ nwụrụ.
Macron a na-ekwu sị," Ọ bụ otu onye gosipụtara ịdịnotu ndị mba Briten n'ime afọ iri asaa" ebe Barak Obama onye bụbu onyeisiala mba Amerịka kwuru sị, " Ọ nọgidere ma mgbe ihe dị mma ma mgbe ihe adịchaghị mma, site na mgbe mmadụ gara n'ọnwa na mgbe ahụaja Berlin dara".
Praịm Mịnịsta Japan bụ Fumio Kishida gosipụtara nwute ya were gwa ndị ntaakụkọ sị , " Ọnwụ Ezenwaanyị ọnye duru mba Briten oge ihe siri ike bụ ọghọm dịịrị ndị Briten na ndị ụwa niile".
Ebe onyeisiala mba Ireland bụ Michael D Higgins kwanyere Ezenwaanyị Elizabeth ugwu dịka onye "nwere ezi mmasị ịrụ ọrụ ya nke ọma" ma kwuo kwa sị, "ọ weere ọnodụ pụrụiche ma akọwa akụkọ ihe mere eme na mba Briten".
N'Akwụkjwọ ozi ọdepụtara ka o kwuru sị, "Eze nwaanyị chịrị mba Briten n'oge oke mgbanwe kama ọ gbara ndị mba Briten ume ma nye ha ezi olileanya".
Taoiseach, Micheál Martin nke mba Ireland kwuru sị, " Ọchịchị Ezenwaanyị gosipụtara ihe iribeama ma sị na ọnwụ ya gosipụtara n'oge pụrụiche agwụla.N'Akwụkwọ ozi Martin depụtara ka o kwuru sị, "uchu Ezenwaanyị tinyere n'ọrụ ya na mmasị ọ nwere n'ebe ọha mmadụ nọ na-egosi akọnuche na na nghọta pụrụiche ọ nwere".
Ọ chetekwara " Okwu obioma na ihe ọma o kwuru" mgbe ọ bịara njem nleta na mba Ireland n'afọ 2011.Odeakwụkwọ ngalaba UN bụ Antonio Guterres kwuru maka Ezenwaanyị Elizabeth were sị, " Ọ bụ ebe ntụkwasị obi oge ụwa na-agbanwe n'ike n'ike, nke gụnyere mmwereonwe Afrịka na Eshịa, na otutu otu Commonwealth".
N'Akwụkwọ ozi ọdepụtara ka o toro Ezenwaanyị were kelee "Etu o siri wepụta obi ya ịrụrụ ndị mba Briten ọrụ. Ụwqa agaghị echefu ọchịchị ya na uchu otinyere ịrụrụ ndị mba ya ọrụ".

Ebe foto si, Getty Images
Ezenwaanyị Elizabeth agaala Australia bụ mba sọ na "Common Wealth" ugboro iri na isii, nke mere ya onye ọchịchị megoro otu ahụ.
Praịm Minista Anthony Albanese sị na ọtụtụ agaghị ama ụwa a ma ọbụghị ya"
Ọ sị na. "agbanyeghị ụzụ na nsogbu dị ebe niile, ọ na anọ jụụ kwanyere onwe ya ugwu".
"Ọ na-anọnyere anya ma n'ọṅụ mana iri uju. Nwekwaa ntachi obi".
Praịm Minista mba New Zealand sị na ọ bụ onye uweojii gbara ọkụ n'ime ụlọ ya n'ime abalị mgbe ọ fọrọ nkeji iri ka ọ kụọ elekere ise nke isii ụtụtụ kpọtere ya nwere zie ya ozi maka ọnwụ Ezenwaanyị.
Ọ sịkwa na "ọ bụ ọpụrụiche... ụbọchị ikpeazụ ọ nọrọ n'ụwa gosiri ụdị mmadụ ọ bụ n'ụdị ọbụla, ka o sị rụgide ọrụ rụọ na ngwụcha igosi ịhụnanya ya na ndị ọ na-achị".

Ebe foto si, Getty Images

Ndị isi maba Afrịka zịgakwaara Ezenwaanyị ozi iru ụjụ bụ onye ma ha nke ọma, bụrụkwa onyeisi Commonwealth.
Onyeisiala mba Kenya ọhụru bụ William Ruto jara ya ike sị na ndị Kenya ga-echeta ya maka ezigbo "adịmnamma" ha nwere.
Kenya bụ obodo nweere onwe ha n'aka Briten n'afọ 1963 bụ ezigbo mba nye Ezenwaanyị. Ọ bụ ebe ahụ ka ọ nọ malite ọrụ dịka Ezenwaanyị. Ya bụ Adaeze bịara ezumike ebe ahụ mgbe ọ gbara afọ iri abụọ na ise mgbe nna ya bụ King George VI nwụrụ n'ọra n'afọ 1952.
Ali Bongo bụ onyeisiala mba Gabon nke mbụ mba kacha ọhụrụ n'otu Commonwealth kwuru sị, " Ezenwaanyị bụị ezigbo enyi Afrịka, Afrịka na-egosi kwa ya ihunanya o gosiri ha".
Ebe onyeisiala mba Gana bụ Nana Akufo-Ado depụtara na twitter ya ma sị na ndị Gana ji ọṅụ echeta ugboro abụọ Ezenwaanyị bịara njem nleta na mba ha ma sị, "O ji obi omịko, ọṅụ ma na-ebu onwe ya nke ọma dịka ọ na-arụ ọrụ ya dịka Ezenwaanyị".Njem Ezenwaanyị mere na mba Gana butere ọtụtụ okwu dịka egwu nchekwa ya tụrụ ụfọdụ ndị dịka ogbunigwe gbara n'isi obodo mba Gana ụbọchị ise tupu ọ bịa. Kama egwu adịghị Ezenwaanyị, ọ mere ya bụ njem ọ chọghị ikagbu ya dịka okagburu ya na mbụ mgbe ọ dị ime Nwaeze Andrew.

Ebe foto si, Getty Images











