Poly Student Ibadan: Ihe anyị ma maka akụkọ nwata akwụkwọ Ibadan Polytechnic a sị nwụrụ n'elu nwaanyị

Ụlọakwụkwọ Ibadan Polytechnic ekwuola nke ha ma n'okwu ọnwụ nwa akwụkwọ ha

Ebe foto si, Ibadan Polytechnic/Facebook

Ndị uweojii Oyo steeti ekwuola na ha anatala ozi maka nwata akwụkwọ Ibadan Polytechnic a sị nwụrụ n'elu enyi ya nwaanyị bụkwa nwa akwụkwọ ụlọakwụkwọ ahụ dị elu ụbọchi Tuzde.

Akụkọ na-efegahịrị na soshal midia na-ebo ebubo na Oromidayo Daniel bụ onye nọ n' afọ nke abụọ n'ụlọ akwụkwọ ahụ nwụrụ dịka ya na enyi ya nwaanyị a chọghị ịkpọ aha ya na-emekọ ruo ọtụtụ awa.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Adewale Osifeso gwara BBC na ha anụla ozi akụkọ ọnwụ nwa amadi ahụ ma gaa n'ihu kwuo na ha amabeghị kpọmkwem ihe kpatara ọnwụ ya.

Ndị isi ụlọakwụkwọ Ibadan Polytechnic agbaala ama n'ezie na otu nwata akwụkwọ nwụrụ n'ụlọakwụkwọ ha dịka akụkọ kọrọ.

Ọnụ na-ekwuru ụlọakwụkwọ mahadum ahụ bụ Soladoye Adewole gwara BBC na aha nwa akwụkwọ ahụ nwụrụ bụ Oromidayo Daniel ma kwuo na amabeghị ihe kpatara ọnwụ ya.

Ọ kwukwara na ya bụ nwata akwụkwọ nọ n'ogogo 'National Diploma' nke abụọ ya bụ klassị nke ikpeazụ ya.

Ụmụakwụkwọ madadum Poly Ibadan ka nọ n'uju n'elu akụkọ ọnwụ ogbo ha

Ebe foto si, POLY IBADAN/FACEBOOK

Adewole kwuru: "Daniel bụ nwata akwụkwọ isi na-acha ọkụ, ọ forọ naanị obere oge ka ha leele ule nke ikepazụ ha".

"Ọ ya bụ onye kacha mara akwụkwọ n'etiti ndị ogbo ya na klassị ikpeazụ a".

O ji obi mgbawa tie ndị ezịnaụlọ Daniel aka n'obi n'ihe a mere.

Akụkọ kwukwara na agbapụtara enyi nwaanyị Daniel n'ime ụlọ ya mgbe a hụrụ ozu ya.

Ebe e kwuru na ya bụ nwada nọ n'agbata ndu na ọnwụ nke Bekee na-akpọ 'Coma'.

Nke a so n'ihe mere ndị mmadụ jiri na-efesa akụkọ a na ha abụọ nọ n'etiti mmekọ were nwụọ.

Ọ bụ aramara gburu nwata akwụkwọ a n'ezie?

Dịka akụkọ na-efegharị na Daniel nwụrụ n'ihi o mere aramara ruo ọtụtụ awa, Soladoye Adewole gara n'ihu kwuo na ya bụ akụkọ achịtaghị aja dịka ọ kọwara na enweghị onye nọ ebe ahụ nwereike ikwu hoo haa na nke bụ eziokwu.

Adewole kwuru "Mmadụ e nwereike ịnwụ n'elu akwa dịka ọ na-eme aramara?"

"Nwata akwụkwọ a anọghị n'ime ụlọ ndịna anyị ihe a mee"

"Nke bụ eziokwu bụ na o bi n'ụlọ ndịna nke na-abughị nke ụlọ akwụkwọ anyị dị n'ezi ụlọakwụkwọ anyị."

Ọ kọwara na nke a mere enweghị onye nọ nso nwereike ịgba ama ihe mere n'ọnwụ nwata a.

Adewole kwuru na ndị uweojii amalitela ọrụ nnyocha n'okwu a.