You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Otu onyeagha nwụrụ n'ihe mberede okporoụzọ na mpaghara Ihiala - Ndịagha Naịjirịa
Ndịagha Naịjirịa akọwaala etu ụgbọala ha si nwee ihe mberede na mpaghara Ihiala n'Anambra Steeti, ebe otu onye agha nọrọ nwụọ.
Onyema Nwachukwu bụ ọnụ na-ekwuru ndị agha kwupụtara nke a n'akwụkwọ ozi o zipụrụ n'ụbọchị Wenezde.
O kwuru na ọ bụ oge ndị agha nwetara mkpesa na ụfọdụ ndị ekperima bucha egbe na-awakpo ndị mmadụ ma na-amanye ha ka ha nọrọ n'ụlọ n'ụbọchị Mọnde, abalị asaa nke Febrụwarị 2022.
"Dịka ndị agha na-agbaga ibuso ndị ekperima ahụ agha, otu n'ime ụgbọala ha nwere ihe mberede okporoụzọ," Nwachukwu dere.
"Otu onye agha nwụrụ n'ihe mberede ahụ ebe mmadụ abụọ ọzọ merụrụ ahụ."
Nwachukwu kwuru na e burula ndị ahụ merụrụ ahụ gaa ụlọọgwụ.
Ọ gara n'ihu kwuo na ndị agha ndị ọzọ gara busokwa ndị ekperima ahụ agha, ha wee kwakọrịta mgbọ.
"Dịka ịkwa mgbọ a na-aga n'ihu, ndị agha gburu onyeisi ndị ekperima ahụ aha ya bụ Ejike, na ndị otu ya atọ ọzọ," Nwachukwu kwuru.
Akụkọ gbasara ụgbọala ndị agha nwere ihe mberede okporoụzọ malitere ifegharị kamgbe ụbọchị Tuzde.
Ụfọdụ akụkọ kwuru na ndị agha nwụrụ na ya bụ ihe mberede ruru mmadụ ise, mana BBC achọpụtabeghị nke a kpọmkwem.
Ugbua, ndị agha akọwaala na ọ bụ naanị otu onye otu ha lara mmụọ na ya bụ ọdachi.
Onyema Nwachukwu bụ ọnụ na-ekwuru ndị agha rịọrọ ndị mmadụ ka ha gaa n'ihu na-ewetara ndị agha ozi ga-enyere ha aka ibuso ndị ekperima agha na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, ma mee ka udo lọghachi.
Enweghi onye agha egburu n'Oduma ubochi Monday
Na nke dịka ibe ya, ndị agha Naịjirịa nọ n'Enugwu ekwuola na onweghị onye ha ndị ekperima gburu n'ụbọchị Mọnde, dịka onyonyo na-efesa na soshal midia si egosi.
Ọ bụ ọnụ na-ekwuru ha bụ Abdulahi Abubakar gwara BBC Igbo nke a n'ụbọchị Wenezde.
Onyonyo ahụ na-efeghari gosiri ebe ndị ekperima gbara ụgbọala ndị agha ọkụ dịka ozu otu onye agha nọ n'ime ya.
Onye na-ekwu okwu n'onyonyo ahụ kwuru na ya bụ ihe mere n'Oduma, Enugwu steeti.
Mana Col. Abdullahi Abubakar kwuru na ihe onyonyo ahụ abụghị n'ụbọchị Mọnde, abalị asaa nke Fenrụwarị 2022 ka o mere.
"Onyonyo ahụ bụ ihe mere n'oge gara aga, ọ bụghị onyonyo ọhụrụ," Abubakar gwara onye ntaakụkọ anyị.
Gọọmentị etiti akọwaala ihe mere mmanụ ụgbọala ji akọ n'Abuja na Legọs
Gọọmentị etiti Naịjiria ekwuola na ha achọpụtala ihe mere ka ndị mmadụ jiri ụjọ na-abụ mmanụ ụgbọala nke mere ka ọ na-akọ n'ụfọdụ mpaghara Legọs na Abuja.
Farouk Ahmed bụ onyeisi ngalaba Nigerian Midstream and Downstream Petroleum Regulatory Agency, kwuru na ọ bụ methanol karịrị ole Naịjiria kwuru ka a na-etinye na mmanụ petrolu, ka a hụrụ n'isi mmiri ebe e si ebuputa ya.
N'akwụkwọ ọzị ha ziputere n'ụtụtụ a, Methanol bụ kemikalụ a na-agbakwụnye na mmanụ petrolu n'oke kwesiri ekwesi.
Ọ sị na ya na dị ọrụ NNPC na dị ọzọ ọnụ na-erụ n'okwu na ọrụ imepụta mmanụ ga-ahụ na ha nyere ndị mmadụ oke ga-ezuru ha.
Ha sị na ha achọpụtala ebe ya bụ ajọ mmiri siri banye opi ụgbọghiri, na ha ga-ejide ha taa ha ahụhụ ka o kwesiri.
Ahmed kwuru na agwa ndị NNPC na ndị ọzọ ọbụ ọrụ ha ime ka mmanụ ụgbọala rụọ ndị mmadụ aka ka ha gbaa mbọ hụ na ha busere ya bụ ahịa n'ụdị ga-abụ na ụkọ ya adịghị.
O kwuru na ndị ọrụ NNPC amalitelarị ime ka ya bụ mmanụ petrolu rụọ ọha aka.
Ndị uweojii amalitela iwuchi ndị ngagharịiwe na Ottawa dịka ha na adọ aka na ntị na ya bụ egwu apụwala na joromi.
Ndị uweojii na mba Kanada adọọla aka na ntị na ndị isi ekwe ọnwụ na ndị isi ike ka nọkwa n'isi obodo mba ahụ na-akwanye nkụ n'ọkụ ngagharịiwe ahụ ndị ọkwọ ụgbụoala 'truck' malitere kemgbe izuụka abụọ n'obodo ahụ.
Ottawa nọ ọnọdụ gbata gbata dịka ndị uweojii mba ahụ na-esi ọnwụ iwete udo ebe ahụ.
Ihe dịka ọkara anọ n'ime ndị ngagharịiwe ahụ kpọrọ onwe ha Freedom Convoy buche ụmụaka nwereike imeru ahụ n'ime ha ọ bụrụ na enwere ka ndị uweojii si chọọ ịchụsa ha n'ike, dịka ndi isi obodo si kwuo ụbọchị Tuzde.
Ihe ruru mkpesa iri asatọ ka ndị uweojii nwetagoro ya bụ abụbụọrụ ndị ọkwọ ụgbụọala 'truck' na-eme maka ya bụ ọgwụ mgbochi ha na-esi ọnwụ na ọbụghị iwu na ha ga-agbarịrị ya.
Ọ bụ eziokwu na ha na-eme ya bụ abụbụ ọrụ n'udo mana ndị uweojii sị na ha na-atụegwu ndị omekome na-agbaso ndị ọchịchị mgba izubanye ebe ahụ kpaa mkpa mkpa.
E nweela mkpesa maka ịkpọ iyi ịkpaoke agbụrụ nakwa nke aramara nwoke maọbụ na nwaayị na ibe ya, ma nke ndị isi aba okpu Nazi.
Ụfọdụ n'ime ha gbara egwu n'ili ndị agha amaghị ndị ha bụ.
Kedụ ka abụbụ ọrụ ndị ọkwọ ụgbụala a nwereike isi bie?
Ndị ọrụ obodo adaala ndị mmadụ nha ma dọkwaa ụfọdụ aka na ndị maka ịkpa aghara ebe ahụ mana ụfọdụ ha obi lara azụ ji egbe mkpọ n'ala iji yie ndị ọrụ obodo egwu ka ha chaa n'ụzọ.
Ha majara otu onye uweojii chọrọ ịnara ha mmanụ ụgbọala ha bụ n'otu "truck".
Onyeisi ndị uweojii bụ Steve Bell dọrọ ha aka na ntị ụbọchị Tuzde si, "onye apụtakwala, maka ọgagha adị nfe".
Ya bụ nwaamadị hụrụ ihe karịrị "truck' otu narị buche ụmụaka n'ime ha, were bekụọ ndị ndị ụlọọrụ na-ahụ maka ọdịmma ụmụaka a kpọrọ "Children's Aid Society" maka ọrịa nwereike ịdakwasa ha site n'oke ụzụ, ọnwụrụ ụgbọala nakwa ihe ntụmadị ndị ọzọ nwereike imetuta ahụike ha.
E megheturu okeala Kanada ụbọchị Tuzde dị ihe ururu maili 740 ruo Ottawa maka ebe niile kpochiri akpochi maka ya bụ abụbụ ọrụ.
ndị ọkwọ ogologo ụgbụala ndị ọzọ ya bụ iwu emetutaghị sozị ibe ha gbachie ezi na ụzọ Ambassador Bridge nille ndị mmadụ sị agafe.