Ned Nwoko, Pamela Ifejoku na esemokwu ala dị n'etiti ndị Idumuje Ugboko

Aha onyonyo, Ned Nwoko, Pamela na esemokwu ala dị n'etiti ndị Idumuje Ugboko

N'ọdị nso a ka otu nwaanyị aha ya bụ Pamela kwara arịrị ma kwuo na Ned Nwoko kpọchiri nna ya na mkpọrọ.

Ned Nwoko bụ ọkaiwu a ma ama ma bụrụkwa onye ọgaranya.

Pamela kwuru na Ned Nwoko ji n'ihi ego ya na-emegbu ọtụtụ ndị mmadụ n'obodo ha bụ Idumuje Ugboko nke dị na Delta Steeti.

O kwuru na Ned Nwoko kpọchiri nna ya na ụfọdụ ndị ọzọ na mkpọrọ n'ihi na ha ekwenyeghi n'okwu ala nke Ned Nwoko chọrọ iwere n'obodo ha iji rụọ Mahadum nakwa ọgbọ egwuregwu 'golf'.

Mana Ned Nwoko kwuru na ọ bụghị naanị ihe gbasara ala ka e ji nwuchie ndị ahụ nọ na mkpọrọ.

Lee ihe anyị chọpụtara gbasara okwu ahụ.

Ndị mere akụkọ a bụ Chukwunaeme Obiejesi, Chukwudi Okereke, Nnamdi Agbanelo na Vining Ogu.