You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Imo Protest: 'Ndi PDP goro ndị mere ngagharị iwe n'Owere ego' - APC Imo Steeti
Otu APC n'Imo Steeti ekwuola na ọbụ ogugo ka ndị PDP goro ndị mere ngagharịiwe n'Owere ụbọchị ụka.
Marcelinus Nlemigbo, onyeisi ndị APC na steeti ahụ kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo.
Nlemigbo kwuru na ọbụghị ndị Imo mere ngagharị iwe ahụ kama ọ bụ ndị PDP bara n'ime obodo goro.
O kwuru sị: "Mgbe INEC kwuru na ọbụ Ihedioha na ndị PDP meriri ntuliaka, anyị emere ngagharịiwe?"
"Anyị ji nwayọ buru okwu anyị gaa ụlọikpe."
"Ugbua ụlọikpe nyere anyị mmeri, gịnị ka ha na-emere ngagharịiwe."
"Ọ bụ ụmụaka ha (ndị PDP) kwụrụ ụgwọ n'Owere ebe a ka ha ji mee ngagharịiwe ahụ."
Onye ntaakụkọ BBC Igbo nọ n'Owere oge ya ngagharịiwe na-aga n'ihu.
Ọtụtụ ndị gwara ya okwu kwuru na obi adịghị ha mma maka nchụpụ a chụpụrụ Ihedioha.
Ngagharịiwe na-abịa dịka Emeka Ihedioha kwuru na ya ewerela ihe etu o si hụ ya.
Ihedioha kwuru nke a oge ndị isi otu PDP bịara ịleta ya n'Abuja n'ụbọchị Satọde.
O kwuru na ya kwenyesiri ike n'ọchịchị onye kwuo uche ya n'agbanyeghị ihe a mere.
Mana o kwuru hoo haa na ya bụ ikpe ndị 'Supreme Court' egosipụtaghị mbunuche ndị Imo steeti na ntuliaka oche gọvanọ e mere n'afọ gara aga.
Connor McGregor etiwaala 'Slate'
Ọgba mgba a ma ama bụ Connor McGregor emeela ya ọzọ!
O jiri naanị ntabi anya iri anọ merie Donald Cerrone na mgba mbụ n'asọmpị UFC kemgbe ọnwa Ọktoba afọ 2018.
N'aka ọzọ
Onyeisioche ngalaba na-ahụ maka mmanụ agbịdị na Naịjirịa bụ NNPC n'aha ịchafụ Mele Kyari ekwuola na ihe dị iche adịla n'ọrụ ịbelata ndị na-emebi okoporo mmanụ agbịdị nakwa ndị na-ezu ya n'ohi.
O kwuru nke a n'akara Twitter ya dịka ọ gara nleta n'ogige ndị agha mmiri dị n'Ojo Legọs.
"Emir Potsikum ndo - Buhari"
Onyeisiala Muhammadu Buhari ezigarala Emir Potiskum bụ Umaru Bubaram ozi itiakanobi maka mwakpo ọ gabigara n'aka ndị omekome bu egbe n'okporoụzọ Kaduna na Zaria.
Ndị uweojiii kwuru na mmadụ anọ na-arụrụ Emir ahụ ọrụ nwụrụ na mwakpo ahụ.
N'Anambra
Gọọmentị Anambra steeti adọọla ndị mmadụ aka na ntị maka ịwụnye atịtị n'ime ọwa mmiri dị icheiche na steeti ahụ
Ha gwara ndị mmadụ kee nkwụcha maka udu mmiri na'abịa ma kwuo na ọ bụrụ na ndị mmadụ gee ntị ọ ga-enyere gọọmentị aka ịchekwa ndụ na ebe obibi ha.
Na mba ofesi,
Dịka usoro nchụpụ onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump na-aga n'ihu, ndị otu ọkaiwu ya ekwuola na usoro ahụ bụ ịwakpo ọchịchị onye kwuo uche ya.
Ọ bụ n'izuụka na-abịa ka a ga-ebido ikpe ya n'ezie.
N'egwuregwu,
Anthony Joshua bụ odogwu n'iti ọkpọ agaala ịleta onyeisiala Naịjirịa dịka ọ nọ na mba Briten.
Joshua kwekwara ya nkwa ị nọchịte anya Naịjirịa ọfụma ma chekwaa aha ya mgbe niile.
Gee akụkọ ụwa n'otu nkeji ebe a