Senator Utazi: Ihe mere m ji gbajuo ike akụrụmgwa 'Constituency Project' mgbe okwesiri

Omeiwu na-anọchịte anya Enugwu Nọt bụ Chukwuka Godfrey Utazi azarala ọnụ ya maka ebubo ngalaba na-ahụ maka nrụrụka na mpụ bụ Independent Corrupt Practices Commission (ICPC) boro ya.

ICPC kpọchiri be Maazị Utazi n'ụbọchị anọ nke ọnwa Ọgọst ma bo ya ebubo na oburu akụrụmgwa gọọmentị so n'usoro Bekee kpọrọ "Consistuency Project" dowe na be yaghara ike ya ndị mmadụ etu o si

kwesi.

Sịnetọ Utazi malitere okwu n'ịsị na ọ bụ ndị iro na-agba ya mgba okpuru butere okwu a.

Ọ sị na nke a bụ ugboro atọ ọ ga-eme atụmatụ "Consistuency Project" kemgbe ya banyere ọkwa dịka onye omeiwu.

"Ihe mere m ejighi kee nke a n'afọ gara aga bụ na m chọrọ ike ya mgbe ezumike m. Achọghịkwa m ike ya mgbe ndọrọndọrọ ka ndị mmadụ ghara iwe ya na m chọrọ iji ya zọta vootu."

Akụkọ ga-amasị gi: