Coach Supremo Chukwu: 'Anaghị m ele onye amaghị agba bọọlụ anya'

Sunday Ogbonnaya Chukwu bụ onye nkuzi bọọlụ ama ama ọfụma n'Enugwu. Ndi dịka Austin Jay-Jay Okocha, Sunday Oliseh, John Utaka na Victor Agali na ndị ọzọ si n'aka ya gafee.

Ọgọọst 4 2019 mere otu afọ nwoke a eji 'Coach Supremo' maọbụ 'Jangaza Supremo' mara nwụrụ. BBC Igbo na ya mere mkparịtaụka otu izu ụka tupu ọ nwụo.

Ihe o tinyere ọnụ gunyere etu o ji achọpụta ndị bọọlụ nwere akara aka nakwa enyemaka gọọmentị ga-enyere egwuregwu bọolụ.

Gee ihe o kwuru n'uju:

Akụkọ ga-amasị gị