Senegal vs Tunisia: Onye ga-ezute Senegal n'ikpeazụ Afcon?

Ebe foto si, AFP
Sịnịgal emeriela mba Tunishia iji ruo agba ikpeazụ nke asọmpi Iko Mba Afrịka nke 2019.
Mmeri a ha meriri site na goolu Dylan Bronn bụ onye mba Tunishia ji aka ya takpuo na neetị ha na nkeji 100, mere ka ha nwee ohere ịzọ ma lee ma aka ha a ga-emetụ Iko asọmpi a ma ncha.
Nke a ga-eme ya naanị mkpụrụ ugboro abụọ Sịnịgala na-eru agba ngwụcha asọmpi a.
Ihe tụrụ ndị mmadụ anya bụ etu mba abụọ a si richaa penariti a dọnyeere ha n'efere, mere ka egwuregwu ha banye agba "gbaa ka anyị laa" ebe e tinyekwuru ha nkeji 30.
Ferjani Sassi nke Tunishia bu ụzọ rie na nkeji 75, ebe Henri Saivet nke Sịnịgal rịwakwara ndị be ha obi na nkeji 81.
Ka anyị 'tụọ down' na mba Libya

Ndị ụlọọrụ United Nations (UN) na-akpọ oku ka e mechie ebe ndị a na-etinye ndị gbara ọsọ ndụ, makana ọnọdụ ebe ahụ adịghị mma ịbụ ebe obibi nye ndị mbịarambịara.
UN kwuru na ha dị njikere inyere ha aka wee na-elekọta ndị mbịarambịara a.
Nke a na-abịa ka ihe karịrị mmadụ iri ise nwụrụ mgbe e si n'ụgbọelu tụsa mgbọ n'ebe a na-edowe ndị gbara ọsọ ndụ n'isiobodo Tripoli izu abụọ gara aga.
Amnesty International na-ebo ndị uweojii Rivas steeti ebubo

Ngalaba na-arụ ọrụ n'efu bụ Amnesty International ekwuola na ọ bụ ndị uweojii butere ọkụ gbagburu mmadụ iri anọ na asatọ n'ụbọchị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Juun na Rivas steeti.
N'akwụkwọ ozi ha zipuru, ha sị na ọ bụ ndị uweojii na-arụ n'Afam dị nso ebe okpo mmanụ na-ehi ehi malitere ịgba egbe ka a jụrụ inye ha aka azụ.
Nnamdi Omoni bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ kwuru na ha emechabeghi nyocha, nke bụ na ha agaghị ekwu ma ihe Amnesty International na-ekwu ọ bụ eziokwu ka ọ bụ asị.
A bịa n'egwuregwu,
Novak Djokovic na Roger Federer na-achịpụ ya ugbua dịka ha na-azọ onye ga-emeri ma bulie iko Wimbledon nke afọ a.

Ebe foto si, Reuters
Federer merie, ọ ga-abụ Iko nke itoolu ya, ebe ọ ga-abụ nke ise ya ma Djokovic buru ya n'afọ gara aga merie.
N'egwuruegwu,
Naịjiria na Algeria ga-akwata n'agba ọkara-ikpeazụ n'elekere asatọ nke abalị Julaị 14, n'asọmcoza
pi Afcon.

Ebe foto si, NFF
Mmadụ abụọ ndị oji ego achụ ego ndị Naịjirịa ekwela nkwa na ha ga-enye ha puku dọla iri ise maka otu goolu ọbụla ha nyere ndị Algeria.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ọnwụ Elizabeth Ndubisi Chukwu

Ebe foto si, Facebook/Chartered Insurance Institute of Nigeria
Onye nnọchite anya Naịjria na Saụt Afrika bụ Godwin Adams ekwuola ka e nyonyekwuo anya n'okwu gbasara ọnwụ Elizabeth Ndubisi Chukwu bụ onye egburu n'obodo ahụ.
Adams na-akọwata na mgbe ụfọdụ na ọ bụ ekewe eketeghị n'etiti ndị Naịjirịa ụfọdụ bụ ihe na-ebute ụdị ọnwụ ike a.
Onye aka ya kwụọtọ ga a bụ onyenche obodo

Ebe foto si, NPF/Facebook
Ọnụ na-ekwụrụ ndị uweojii na Naịjirịa bụ Frank Mba ekwuola na ọ bụ ndị aka ha dị ọcha ka ekwesiri ịnabata na ọrụ nchekwa ime obodo.
Na mkparịta ụka ya na ndị nta akụkọ, Frank kwuru na obodo ọbụla nwere ikike ịbido ndị otu nchekwa obodo nke ha ma ha soro usoro iwu kwuru.
Ndi ogbu ara ọnara a hapụla iruuju, anyammiri na ọbara na Somalia

Ebe foto si, AFP/Getty Images
N'ofesi, mmadụ iri abụọ na isii anwụọla na ogbunigwe na egbe ndị omekome gbara n'ụlọ oriri na nkwari dị na Kismayo, Somalia.
Ndị ogbu ara ọbara kpọrọ onwe ha al-Shabab ji ya bụ arụrụala anya isi.
Obasanjo sị na a ga-ahụ isi nsogbu nchekwa na Naịjirịa

Onye bụbu onyeisiala Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo etinyeela ọnụ na nkatọ ogbugbu Funke Olakunrin bụ nwa onyeisi ndị Afenifere bụ Funke Olakunrin nke a na-eche na ndị ọchị ehi dị na ọnwụ ya.
Obasanjo gwara gọmenti ka ha jisike jide ndị rụrụ ala ahụ taa ha ahụhụ dịka iwu kwuru.
N'aka ọzọ, onyeisiala Muhammadu Buhari ekwela nkwa na ndị ọrụ nchekwa ga-achọtariri ndị mere ya bụ ihe ma taa ha ahụhụ ka okwesiri.











