You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Abacha loot: Ụmụ Naijiria chọrọ ịtapụ Abacha nti ya
Anaghị ekwu ajọ okwu maka onye nwụrụ anwụ mana ụmụ Naijiria ekweghị na nke a n'ebe ọ gbasara onyeisiala chibụrụ Naijiria bụ Sani Abacha.
Ọtụtụ ha egosiputala itunanya dị ukwu dịka na-achọputa ego a sị na Abacha zupuru oge ọ chịburu.
N'ụbọchị Tuzde, ụlọikpe dị na mba Briten nyere iwu ka e jichie narị paund abụọ na iri na otu nke pụtara ijeri naira iri asatọ na abụọ (N82 billion) bụ nke ha si na Sani Abacha zupụrụ.
Akwụkwọ akụkọ Metro.UK kwuru na ọ bụ n'aha ụlọ ọrụ British Virgin Islands a kpọrọ "Doraville Properties Corporation" ka Abacha zoro ego ahụ.
Ọtụtụ ndị tinyere ọnụ n'okwu ahụ gbapụru ụrịọm kwuo na Abacha mekpọrọ ala, ebe ndi ọzọ ji ya akpa ọchị na-ekwu na ya bu onyeisiala ka na-ezitere Naijiria ego n'agbanyeghị na ọ nwụọlari ihe karịrị afọ iri abụọ gara aga.
Lee ihe ha na-ekwu:
@stjudendukwe kwuru na Abacha nwekwara ike izuru ọkụ nile dị n'ọkụmmụọ
@OgbeniDipo n'aka nke ya si na Abacha zupuru Nigeria mkpụrụ ọkwụrụ n'anya.
Ọ gbagwojuru @DaParrot anya ihe kpatara Naijiria ji ka nọdụ n'ụbiam nakwa agba mbibi ego ebe ọ bụ na enwetara ego buru ibu otua n'aka Abacha.
@snowice91 kwuru na Abacha bu onyeisiala chiburu Naijiria kacha nwee obiọma nke na ọ naghị ahapụ izite ego kwa mgbe kwa mgbe.
@OncleDavidJosh jụrụ ihe ejirila ego ndị mbu e nwetara n'aka Abacha mee.
@ArewaTwiter sịrị na Abacha enyela Naijiria onyinye Sallah.
@el_shuaybb rịọrọ Onyeisiala Muhammadu Buhari ka o were ego ahụ mee ihe bara uru.
Lekwa ihe ndị ọzọ kwuru maka ya:
Kemgbe Abacha nwụchara n' afọ 1998, gọọmentị Naijiria ewechighatala nnụkwuru nnụ ego bụ nke ha sị na Abacha zoro n'ọbaego dị iche iche n'akụkụ ụwa nile.
N'afọ 2018, gọọmenti mba Swizzerland nyeghachiri Naijiria narị nde paunds atọ (£300 million) bụ ego Abacha zupụrụ.
Akụkọ ga-amasị gi: