Guinea Bissau: Buhari enyela mba a $500,000 maka ntuliaka ha

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Akụkọ ndị dị mkpa:

Buhari enyela mba Guinea Bissau $500,000 maka ntuliaka ha

Muhummadu Buhari

Ebe foto si, @GarShehu

Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari enyela mba Guinea Bissau puku nari ise dọla na akọrọngwa ndị ọzọ iji kwado ntuliaka ha.

Akọrọngwa ndị ahụ gụnyere ngwongworo abụọ, ụgbọala Hilux ise, ọgbatumtum iri, bụ iji kwado ntuliaka maka ọkwa ndị omeiwu nke mba ahụ.

N'ozi ọnụ na-ekwuru Buhari bụ Garba Shehu wepụtara, enyemaka ahụ bụ n'ọsịsa nye mbeku nke gọọmenti mba Guinea Bissau bekuru ya.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Mba Guinea Bissau bụ mba dị n'ọdịda-anyanwụ Afrika nke ndị Pọtụgizi chịrị tupu ha nwe nnwereonwe n'afọ 1973.

Dịka CIA World Factbook siri depụta ya na webụsait ha, Guinea Bissau nwere okpukperechi dị icheiche gụnyere ndị ụka Alakụba( pasentị 45) ndị ụka Kraisti (pasentị 22) Christians, na ndị ụka ọdịnala dị (pasent 414.9)

Ụgwọ opekatampe abụghị naanị maka ndị ọrụ gọọmentị

Ndị ọrụ NLC

Ebe foto si, AFP

Onyeisi otu jikọtara ndị ọrụ bụ Ayuba Waba kwuru na onye ọbụla nwere ndị ọrụ karịrị iri abụọ na ise ga-eso ndị gọọmentị na-akwụ ụgwọ a.

Waba kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ndị ụlọ ntaakụkọ Channel TV nwere taa.

Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụghị naanị ndị na-arụrụ goomentị ọrụ ka a na-akwụ ụgwọ opekatampe puku naịra iri atọ.

N'ofesi

Ndị egburu na mwakpo Sri Lanka

Ebe foto si, Getty Images

Onyeisi ndị oyi ndụ egwu wakporo mba Sri Lanka n'ụbọchị Easter so nwụọ n'ime mwakpọ ahụ ha mere.

Nwa amadị a akpọrọ Zahran Hashim nwụrụ n'ụlọ ndịna Shangri-La bụ nke so n'ebe ha wakporo.

N'egwuregwu

Heracio Sala ji photo nwa ya bụ Emiliano Sala

Nna onye ọgba bọọlụ bụ Emiliano Sala, nwụrụ n'ihe mberede ụgbọelu e soro nwa ya nwụọ dịka ọnwa atọ gachara.

Heracio Sala gbara afọ iri ise na asatọ nwụrụ n'ụbọchị Fraịde abalị iri abụọ na isii nke ọnwa Eprelụ 2019 n'ihi obi nkolopu.

Nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri

Aha onyonyo, Ihe omimi dị n’emume Ikeji Arọndizuọgụ

A machiela ngagharị na Kajuru

El-Rufai bụ gọvanọ Kaduna steeti

Ebe foto si, Facebook/El-rufai

Gọọmenti Kaduna steeti amachiela ngagharị n'okpuru ọchịchị Kajuru dị na steeti ahụ ka e gbuchara mmadụ atọ ma mụnye otu obodo ọkụ.

Kajuru nọ n'ọgbaghara na nso nso dịka akụkọ gbu,gbuo gbuo si ebe ahụ apụta.

Mana o bidoro na-ede jiji kemgbe Tọzde ka a hụchara ozu otu nwa Awụsa n'ime olulu.

Iji bọrọ ọnwụ nwanwoke ahụ, ụmụ ndị Awụsa gara wakpo ụmụaka ndị Adara abụọ ka ha na-alọta ahịa tie ha, e bugara otu n'ụlọgwụ , ọ nwụọ n'ụtụtụ taa bụ Fraide.

Nke a kpalitere egwu nke na ndị ọrụ nchekwa nwujuru ebe niile na mpaghara ahụ.

Nwaanyị onyeocha na-egwu wayo

Anna Sorokin

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Anna Sorokin

Otu ụlọikpe dị na mba Amerịka amaala otu nwaayị onye ocha ikpe ohi maka ji aghụghọ anapụta ndị mmadụ ego were ebi ndụ alabanko.

Anna Sorokin, onye na-agwa ndị mmadụ na ya bụ nwa ọgaranya na-ekpori ndụ n'ụlọoriri na nkwarị kacha oke ọnụ ahịa ma na- agba ụgbọelu ndị enyị ya, ndị ụlọakụ na ụlọọrụ ndị kwenyere na ụgha ya kwụrụ ụgwọ ya.

Ụnụ ghọtahiere ihe kwuru -Ngige

Chris Ngige

Ebe foto si, @LabourMinNG

Nkọwa foto, Ngige so na Kọmiti na-ahụ maka ibuli ụgwọọnwa

Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige agọọla ụkwụ n'aka ya na ihe a sị na ya kwuru maka ndị dọkịta abụghị etu ya siri kwuo ya.

O kwuru ka ihe ya kwuru bụ na ndị dọkịta anaghị enwe ohere ọzụzụ na Naijiria nke mere ha ji aga alabekee maka ịgụwanye akwụkwọ iji bụrụ ọkaibe n'ọrụ ha nke bụ ihe ọma nyere Naijiria dịka ha na-ezilata ego na ihe ha mụtara n'ala bekee.Gọọmenti etiti etinyele ego na nchekwa agbata ya mba ndị ọzọ.

A mapụtala N52bn maka nchekwa

Yemi Osinbajo

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Yemi Osinbanjo, Osote onyeisiala na-anọchite onyeisiala Muhammadu dịka ọ gara njem alabekee

Gọọmenti etiti ebinyela aka n'akwụkwọ ijeri dola iri ise na abụọ bụ ego a mapụtara maka iji teknụzụ echekwa agbata Naijiria na mba ndị ọzọ. Ọ bụ Osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo bu onye mere nke a na nzuko ya na ndị imeobi gọọmenti mere ụbọchị Tọzde.

Ikwu megide agbụrụ

Raheem Sterling na Gareth Southgate

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Raheem Sterling natara nzere ahụ n'aka onye nchịkọta Gareth Southgate

N'egwuregwu,

Raheem Sterling bụ onye egwu Manchester City eritela nturuugo maka ikwugide ịkpa oke agbụrụ nke BT Sport Industry Awards nyere ya ụbọchị Tọzde.

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile