You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Atiku Abubakar Address: ihe iri Atiku kwuru taa n'ozi ọ gbasara
Atiku Abubakar, onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'aha otu pati PDP gwara ọha Naijiria okwu taa ebe ọ nọrọ rịọ do, do, do ka ha pụta mee ntuliaka ụbọchị Satode na-abịa.
Lee ọkpụrụkpụ ọkwụ ndị si n'ọnụ Atiku pụta:
1. Agaala m na mpaghara dị icheiche na Naijiria ebe m gwara ụmụ Naijiria n'ogbe ụnụ ebumnobi m gbasara ime ka Naijiria gawa kwa n'ihu ọzọ
2. Achọrọ m ịgba ụnụ ume ka ụnụ pụta tụọ vootu ụbọchị Satode na-abịa bụ Febụwarị 23
3. Vootu ọbụla dị mkpa
4. Ọ bụrụ na ị tụghị vootu, ihe i na-ekwu bụ ihe dịrị etu ọ dị ugbua
5. Ọdịnaihu Naijiria dị gị n'aka
6. Ike ime ka Naijiria gawakwa n'ihu ọzọ dị n'akwụkwọ ntuliaka gị
7. Atụfula ike gị a site na ịnọrọ n'ụlọ
8. Ekwela ka wuruwuru mee na ị pụtaghị n'ihi na ị pụta, ndị mmadụ pụta n'igwe, wuruwuru agaghịkwa adị ire
9. Ọ bụrụ na i nweghị ọrụ, Satode bụ ụbọchị i nwere ohere ịgbanwe ọnọdụ gị
10. Aga m atụ vootu ụbọchị Satode, pụta soro m tụọ vootu n'agbanyeghị pati ị chọrọ itunyere.