You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
2019 Presidential Debate: Ihe mere Buhari ejighi bịa
Buhari ekwuola na ọ bụ abataghị Abuja n'oge naghara ya ị bịa na nrụrịtaụka nke ọgbakọ mgbasaozi Naịjirịa bụ BON n'aha ịchafụ hibere na mgbede ụbọchị satọde.
Ndị a tụrụ anya na ha ga awụchi n'ebe ahụ bụ Kingsley Moghalu (YPP) Oby Ezekwesili (ACPN) Atiku Abubakara (PDP) Fela Durotoye (ANN) nakwa onyeisiala Muhammadu Buhari (APC).
Mana Atiku Abubakar nke APC bịara na ya bụ ọgbọ nrụrịtaụka mana o sonyeghi n'ihi na onyeisiala Muhammadu Buhari abịaghị.
Ọ bụ sọsọ Oby Ezekwesili, Fela Durotoye nakwa Kingsley Moghalu bụ ndị sonyere na ya bụ nrụrịtaụka.
Ihe ha kwuru
Fela Durotoye kwuru na ọ ga anwụchi nne na nna ọbụla jụrụ na nwa ya ga-aga ụlọakwụkwọ ma mee kwa ohere ka ụmụaka ndị enweghi ohere ị ga akwụkwọ n'ụtụtụ gaa ya na mgbede.
Kingsley Moghalu kwuru na ọchịchị ya ga-abụ nke nhatanha. O kwukwara na onye mmadụ niile ga-enweta ohere ruru ha n'ọchịchị ya.
Oby Ezekwesili kwuru na mmadụ abụọ n'egosighi ihu na ya bụ nrụrịtaụka pụtara na ha ejirila aka ha wepu onwe ha n'ihe gbasara ọchịchị
Ihe ụmụ Naịjirịa kwuru
Adaku Ufere kwuru na etu Fela Durotoye siri kpọ ogbo ya aha adịghị mma.
Ismail Aniemu kwuru na ọbịbịa Buhari na Atiku abịaghị mere nrụrịtaụka ahụ ka ọ dị ka ihe egwuregwu
Ebe Alexis Obi kwuru na ndị na-atọ sonyere na ya bụ nrụrịtaụka kwesiri ị ga kuzie nkuzi n'ihi na ha agaghị achịnwu Naịjirịa
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị