Let's Get Nigeria Working Again: Aga m eji ọrụ, nchekwa na ndinotu chọọ ụmụ Naịjirịa mma

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Onye ji aha PDP azọ ọkwa onyeisiala bụ Atiku Abubakar na osote ya bụ Peter Obi amalitela ịgba ọsọ achụm nta Vootu na Sokoto Steeti bụ otu n'ime ọdịda anyanwụ ugwu.

N'ozi ha wepụtara n'akara twitter ndị PDP, ha kwuru na ntuliaka 2019 bụ maka ọdịnihu ụmụaka na ndị ntoroọbịa Naịjirịa.

Ndị otu pati si na steeti asaa gụnyere Sokoto, Zamfara, Kebbi, Jigawa, Katsina, Kano nakwa Kaduna so ya mgbe ọ gara imalite ịchụ nta vootu.

A na-tụ anya na Atiku ga-emepekwa ụlọọrụ ịchụ nta vootu ya nke ga-adị na Sokoto.

Ndị otu pati PDP kwuru na ha kwenyere na ọ bụ mpaghara ọdịda anyanwụ ga-edu ụzọ na Naịjirịa ma kwetekwa na ọ bụ Atiku ga-azọta oche onyeisiala na ntuliaka 2019.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: