You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
#FaintingDanceChallenge: Ọ bụzị ịma aka ka ụmụ Naịjirịa ji biri?
- Onye dere ya, Chioma Obianinwa
- Ndị mere akụkọ a, Senior Broadcast Journalist, Igbo
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3
Ufodụ ụmụ Naijiria na bụ ụgbọ ọbụla gaferela, ha soro ya gawa.
Nke a gụnyere ị ma aka dị iche iche wurulanụ ma gafee na etu o si metụta ụfọdụ ụmụ Naịjirịa.
Anyi ga-ebido na nke na-ewu ugbua akpọrọ "#IdibalaChallenge"
Ọtụtụ mmadụ na-akpọkwa ya "Fainting dance" bụ egwu na-eme ka ndị mmadụ dinaa ka ndị kụbiri ume ebe ọ bụla ha hụrụ onwe ha ma egwu so ya na-akpọ.
Ụfọdụ na-edina na mmiri maọbụ na okporoụzọ.
Kamgbe ọ pụtachara, ụfọdụ ụmụ Naịjirịa ṅomiri ya ma tinye ya na soshal midia ka ụwa kirie.
Ọ bụkwa otiegwu onye mba South Afirịka akpọrọ King Monada tiri egwu a.
O kwuru na ọ bụ maka obi enyi ya nwaanyi gbawara mere o ji arịa ọrịa ndatu n'egwu ahụ.
Aha Egwu a bụ Malwedhe.
#KupeChallenge
Kamgbe ụmụ okorọbịa anọ si na mba France wepụtachara ihe onyoonyo ebe ha na-agba egwu "Kupe," social midia nwuuru ọkụ.
Kupe bụ egwu otiegwu si mba Ghana akpọrọ Ebonyi tiputere.
Mana ndị mmadụ na-ekwu na ihe mere egwu ụmụ okoroọbịa a ji pụọ iche bụ na ha bụ onu gbajie "ụmụ nwaanyị."
Ụfọdụ ụmụ Naịjirịa ji akara akpọro #KupeChallenge wee gbawa egwu a ụmụ okorọbịa gbara.
Nke a mere ka ụmụ okorọbịa a gbara Kupe wuchie na Naịjịrịa.
Ọzọkwa kopuru mba ụwa bụ #KikiChallenge#InMyFeelingsChallenge
Ị maka aka a bụ ebe mmadụ ga-esi na ụgbọala ya ka na-aga n'ụzọ wụpụ gbawa egwu.
O bidoro wube na soshal midia n'ọnwa July nke afọ 2018.
Ọ bụ otiegwu ama ama na Kanada tiputere egwu a mana ọ bụghị ya mere ka ndị mmadụ were ya na-eme ị ma aka.
Otu onye na-eme ihe nkiri ama ama na mba America bụ Will Smith mebigara nke ya oke.
Lekwa nke nwata nwaanyị a:
#MannequinChallenge
N'afọ 2016, ụmụ akwụkwọ mba Amerika bidoro ị kwụ ka nwa bebi eji akpọsa ahịa akwa ma egwu na-eti.
Ọtụtụ mmadụ pụtara mewe ihe a tụmmadị na Naịjirịa.
#MannequinChallenge bụ okwu eji mara ya na internet mgbe ahụ.
Onweghị ihe achọpụtara na ọ bụ maka ya ka eji wepụta ya bụ ịma aka .
Ndị mmadụ na-eche na ọ bụ maka ịkpaọchị ka ndị mmadụ ji eme ya mgbe o wuru.
Ndị dịka Hillary Clinton, nwunye onye chiburu Mba Amerika bụ Michelle Obama so na ndị mere ya bụ ịma aka mgbe owuru na soshal midia.
#IceBucketChallenge
Ihe ọzọ wuru ewu na soshal midia ndị dịka ome ihe nkiri bụ Genevive Nnaji mere bụ nke akpọrọ "Ice Bucket Challenge".
Ndị mba Amerika wepụtara ihe a ka ha wee mee ka ndị mmadụ mara maka ọrịa agwọta agwọta bụ "Amyotrophic Lateral Sclerosis" na-eme na be ha n'afọ 2014.
Mana ọtụtụ ụmụ Naịjrịa ga buru ya n'isi.
Ndị ama ama so mee ịhe a gụnyere aka chiburu Mba America bụ George W. Bush, Mike Zuckerberg, Don Jazzy, Davido, Ice Prince nakwa ndị ọzọ.
@davidoofficial mere nke ya.
Ka ọ dị ugbua, ndị mmadụ dịka ha na-eche ka ịma aka pụta ka ha were ya na-eme ihe ịkpaọchị. Ọnye ma nke ga-fịọ ọzọ.
Akụkọ ndị ga-amasị gị: