You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ dị mkpa: Enwe achụọla ọkwọ ụgbọala n'ọrụ
Na mba ofesi
A kwụsịla otu onye na-anya ụgbọala na mba India ọrụ ịkwọ ụgbọala makana o kwere ka enwe nyaa ụgbọala ya nke mmadụ ruru iri na atọ nọ n'ime ya.
Ntụliaka imeụlọ PDP
Ntụliaka imeụlọ PDP Ka na-aga n'ihu ebe ndị otu Pati ahụ biara ịtụ vootu edenyechala aha n'akwụkwọ ma na-eche ka ntuliaka bido.
Ihe karịrị mmadụ puku atọ ga-atụ vootu taa na ya bụ ọgbakọ ebe e nwere mmadụ iri na abụọ na-azọ oche onyeisiala n'etiti ha.
Onye Igbo ga-anọchite ndị bi na Lagos
Onye Igbo azọtala ohere ị nọchite anya ndị bi n'Isolo /Mushin dị na Lagos steeti.
Aha ya bụ Jude Emeka Idimogu. O si na PDP fee na pati APC.
N'egwuregwu,
Ndị otu Man. Utd ekwuola na-asịrị na-agagharị na aga achụ onyeisi ha bụ Jose Mourinho n'ọrụ dịka okwu na-enweghị isi.
Okwu a bidoro kamgbe otu Manchester United dachara na mbido egwuregwu agba ọhụrụ Premiere league.
Gere akụkọ mere na mgbede a na nkeji:
Ihe nkiri taa