Ogbugbu mmadụ na Benue: Miyetti Allah kwesiri ịza ajụjụ - Gowon

Onyechiburu Naịjirịa dịka onyeisiala n'oge garaaga bụ Yakubu Gowon ekwuola na obi gbariri ya agbari maka ọtụtụ mmadụ nwụrụ n'aka ndị na-achị ehi buru egbe na steeti di iche iche n'afọ a.

N'ime ogbakọ Gowon na gọvanọ Benue steeti bụ Samuel Ortom mere, o kwuru na oge eruola ndị ọrụ nche dị iche iche n'ala Naịjirịa gbara onyeisi ndị otu Miyetti Allah Kautal Hore ajụjụ ọnụ ga-akọwa ihe mere udi ihea na-eme n'ala a.

Gowon kwukwara na ọbụrụ na ogbugbu a akwụsịghị, o nwere ike ịbute agha okpukpe na Naịjirịa.

N'ọnụ okwu ya: "Ọ gbagwojuru m anya na udi ihea na-eme na kwa ruo ugbua onweghị ihe gọọmentị mere juru ọnụ ịkwụsị ogbugbu a"

Gowon nyere Otom mmesi obi na ya ga-agba mgbọ na-ekpe ekpere ka udi ihea kwusi n'ala Naịjirịa.

Onye nọchịrị Ortom n'ọgbakọ a bụ Benson Abounu kele Gowon maka okwu o kwuru, na kwa rịọ na oge eruola ndị ama ama dịka ndị okwu juru n'ọnụ na Naịjirịa tinyere ọnụ n'ogbugbu na-eme ugbua na Naịjirịa.

Akụkọ ga-amasị gị