Ụloikpe jụrụ inye Shekarau akwụkwọ ifepụ gaa Hajj

Ibrahim Shekarau

Ebe foto si, Ibrahim Shekarau/Facebook

Nkọwa foto, Ibrahim Shekarau chịburu dịka Gọvanọ Kano steeti

Ọkaikpe Zainab Bage Abubakar nke ụlọikpe ukwu dị na Kano ajụla inye onye bụbu Gọvanọ Kano steeti bụ Ibrahim Shekarau akwụkwọ njirimara onye na mba ụwa(international passport) maka ịga mba Saudi Arebia maka hajj.

Ngalaba gọọmenti na-alụ ọgụ megide mpụ na mmerụaka bụ EFCC n'aha ịchafụ gbara Shekarau na mmadụ abụọ ndị ọzọ; Aminu Bashir Wali na Mansur Ahmed, akwụkwọ maka ebubo na ha kere ego nde naịra 950 nke si n' ime ego nde dọla 115 bụ ego Deizani Alison-Madueke onye bụbu mịnịsta na-ahụ maka mmanụ agbidi mefuru maka ntuliaka 2015.

Shekarau rịrọrọ ụlọikpe n'akwụkwọ o degara ha n'abalị 28 ọnwa Mee ka e nye ya akwụkwọ iji nyere ya aka mee njem bido n'abali 30 ọnwa Mee rue Juun 23 maka hajj.

Mana oge ikpe ahụ ruru, Ọkaikpe Zainab Abubakar jụrụ imere ya ihe ọ rịọrọ.

Abụbakar kwuru: 'Ka m tulechara akwụkwọ ahụ nke o tinyere iji rịọ arịrịo ahụ, ma hụkwa ọsịsa nke e nyere n'okwu ahụ, ahụrụ m na ọdịghị mkpa inye onye rịọrọ arịrịọ a ihe ọ rịọrọ."

Akụkọ ga-amasị gị: