You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Anwuchiela ndịngwupụta ndị mba China anọ
Ndị mba China anọ agawala ụlọmkpọrọ maka ime ngwupụta ọnatarachi megidere iwu ha na-eme.
Ndị uweoji na ndị agha nwụchiri ha na ndị Naịjiria ruru iri na isii so ha arụ ọrụ.
E jidere ha ebe ha na eme ngwupụta ihe ọnatarachi na mpaghara Ebonyi steeti nke dị n'ọdịda anyanwu.
Ndị ọrụ gọọmenti kwuru na ha ga-akpụga ha ụlọikpe mgbe e mechara nyocha.
Ha kwukwara na ha ekwekorịtala ị bụso igwupụta ihe ndị amabidoro n'iwu ma kwado nchekwa ndị ọrụ ngwuputa nke gọọmentị
China bụ aha ama ama n'ihe gbasara ngwuputa dị ịcheiche na Naịjirịa.
Lekwa ihe onye ntaakụkọ BBC bụ Ishaq Khalid kwuru: